Babangida kwụsiri ike n'ozi nke mbụ sịrị na Buhari adịghị achita

Ọgagun Ibrahim Babangida

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, IBB ejighị ahụ.
Mgbe e biputara ya

Onye bụbu onyeisi ala Naịjiria bụ Ibrahim Babangida ekwuola na ya kwụsiri ike n'okwu mbụ ya kwụrụ banyere ihe na-eme na Naịjirịa ugbua.

E nwere mgbakwojuanya ụnyaahụ ebe ozi abụọ a sị sitere n'aka Babangida nọ na-agba okirikiri ụlọọrụ ntaakụkọ dị icheiche.

Ozi nke mbụ ji aka ike na-akọwa na Naịjirịa anaghị aga iru etu o si kwesi.

Ozi nke abụọ na-akọwa n'ozi nke mbụ esighị aka Babangida.

Ka o si kwụrụ n'utụtụ taa, ndi mmadụ amaghị okwu nke ha ga-eso.

Mana, n'ime akwụkwọ ntaakụkọ Thisday, Babangida kwụrụ sị n'ozi nke mbụ bụ nke si n'ọnụ ya.

O kwuru na ọ bụ ndị ozi ya zipụrụ ozi nke abụọ ahụ.

Thisday gara n'iru kọwa na ọ bụ ọkpara Babangida akpọrọ Mohammed binyere aka n'ozi nke abụọ.

Ha kwụrụ na Mohammed mere nke a maka o na-ele anya ka ogbochie anya ọjọọ ndị kwenyere na ọchịchị onyeisiala Muhammadu Buhari nwere ike ile nna ya.

Otu onye na-ekwu okwu maka ihe na-eme na Naịjirịa ama ama bụ Nicholas Ibekwe gwara BBC Igbo na okwu a Babangida kwuru na-eegosi na ndị ekwenyeghị n'ọchichị Buhari na abawanye.

Ọ sịkwa na ka ọ bụ na onye ama ama ka onye na-ekwuchitere Babangida wepụtara ozi nke mbụ, ekwesịghị ita ya ụta.

Aha onyonyo, Babangida kwuru ihe ọtụtụ mmadụ na-ekwu maka Buhari

Mazi Ibekwe gwara anyị sị:"Ọ bụ eziokwu na e nwere mkpị na ozi nke mbụ, mana Babangida apụtala kwuo na ọ bụ ya nwe ozi ahụ. Kassim Afegbua na onwe ya pụtara na Channels TV n'abali ụnyaahụ wee kwuo na ọ bụ onyeisi ya nwe ozi o wepụtara."

Ọ gakwara n'iru kwuo ka e lota na Babangida bụ onye ama ama maka ikwu ọnụ abụọ, mere eji akpọ ya "Maradona" mgbe o na achị Naịjirịa. Babangida na onwe ya kpọrọ onwe ya "Evil Genius".

"E lee ozi nke abụọ a anya ọfụma, ị ga-ahụ na e denyere Babangida ọkwa dịka GCON, mana ọkwa eji mara ya bu GCFR. Ọ bụ ihe ọmụma ma ya bụrụ na IBB amaghazị ọkwa ya."