Mmachi njem na ihe ndị ọzọ gọọmenti Nigeria na-eme igbochi mfesasị ọrịa Ebola

Onyeisi ọrụ na Nigeria bụ Femi Gbajabiamila
Nkọwa foto, Femi Gbajabiamila
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Kemgbe otu onye si mba Uganda bata Nigeria bidoro igosi njirimara ọrịa Ebola, gọọmenti Nigeria ewepụtala atụmatụ dị iche iche ha chọrọ iji gbochie mfesasị ọrịa ahụ ma na-agwa ọhanaeze ka ha ghara ịtụ egwu.

Mịnịsta na-ahụ maka ahụike bụ Muhammad Ali Pate kwuru na onye ahụ bubatara ọrịa ahụ na mmadụ 44 nwere mmekọta.

Ọ sị na mmekọta ahụ nwereike ime ka o bunye ndị ahụ ọrịa Ebola. Ha kwuru na onye ahụ bubatara ọrịa Ebola na Nigeria na mmadụ abụọ na-arụrụ ya ọrụ na-egosi njirimaara ọrịa ebola.

Mana mịnịsta na-ahụ maka ọdọụgbọelu bụ Festus Keyamo nyere iwu ka a machie mmadụ iri anọ na isii (46) ime njem ụgbọelu abalị iri abụọ na otu. Ndị nke a metụtara bụ ndị a na-enyo na ha na nwaanyị ahụ si Uganda bubata ọrịa Ebola na Nigeria nwere mmekọta.

Keyamo kwuru na ọdọụgbọelu niile dị na Nigeria ga-eke nkwụcha maka ndị na-abata nakwa ndị na-apụ na Nigeria.

Onyeisi ọrụ na Nigeria bụ Femi Gbajabiamila

Nkwa Gọọmenti etiti Nigeria na-ekwe maka Ebola

Onyeisi ọrụ nke Onyeisiala Nigeria bụ Femi Gbajabiamila kwuru na Nigeria were ihe niile iji busoo ọrị Ebola agha.

Gbajabiamila bụ onyeisi kọmịtii gọọmenti etiti hiwere maka ịchụ ọrịa Ebola ọsọ ụkwụ erughi ala kwuru na kọmitii ahụ e hiwere kamgbe June 2026 na-arụ ọrụ ha ma kwuo na ọ bụ nke mere e ji chọpụta nwaanyị ahụ si mba Uganda bubata Ebola na Nigeria.

Ọ sị na "kemgbe ọnwa Juun na ụgbọelu ruru 44,000 efebetala ma fepụ na Nigeria ma kwuo na ndị ọrụ ahụike nakwa ndị niile so na kọmitii ahụ na-agba mbọ ishi imi n'ala"

Ihe Mịnịstrị ahụike na Nigeria merela

Mịnịsta na-ahụ maka ahụike bụ Muhammad Ali Pate
Nkọwa foto, Muhammad Ali Pate

N'ozi Mịnịstrị na-ahụ maka ahụike na Nigeria kesara n'akara X ha kọwara na ọ bụ nwaanyị si mba Uganda bata Nigeria bubatara ọrịa Ebola.

Ha sị na nnyocha ha mere n'ụlọọgwụ kwuru kpọmkwen na nwaanyị ahụ malitere ịrịa ọrịa na October 20, 2026.

Ha sị na-ebidola ịchọ mmadụ 44 nwaanyị ahụ nwereike imetụaka maọbụ bunye nje ahụ.

Ha gwara ụlọọgwụ niile ka ha mepee anya maka onye ọbụla nwereike igosi njiri mara ebola.

Etu mmadu ga-esi gbanarị ibute ebola

Mịnịstrị ahụike na Nigeria bụ Muhammad Ali Pate kwuru na ọ bu ọbala maọbụ mmiri ọbụla si n'ahụ onye nwere ebola ka e si ekesa ya.

Ọzọ bụ na mmadụ nwereike ibute ya mgbe ahụ ya meturu ihe ọbụla ebola dị na ya.

Ha sị na onye nwere ebola ga-ekesa ya mgbe ahụ ya bidoro na-egosi njiri mara ebola.

Ha gwara ndị mmadu atụkwala ụjọ kama ha dị njikere fie asaa n'anya maka onye nwereike ibute nje ahụ.

Ha kwuru na njiri mara Ebola gunyere:

Ahụọkụ

Nnukwu isi ọwụwa

Ọyụyụ na ọgbụgbọ

Ihe anyị ma maka onye bubatara Ebola na Nigeria

Ụlọọrụ na ahụ maka nje bụ 'Africa Centres for Disease Control and Prevention' kwuru na nwaanyị ahụ bubatara ọrịa Ebola na Nigeria bụ onye a mụrụ na mba Uganda.

Nwaanyị ahụ na dị ya batara n'Abuja n'October 3, 2026.

Onyeisi Africa CDC bụ Jean Kaseya kwuru na ha na ndị Nigeria, Uganda, na DRC Congo na-akpa nkata iji mara etu a ga-esi gbochie ọrịa ahụ ifesasi.

"Mana a chọrọ ka nwaanyị ahụ na-agwa ndi Nigeria ihe ọ ma. O kwesiri ịgwa anyị ma ọ bụ eziokwu na o fegara DRC, gaa Kampala, nwe ndị o zutere na DRC".