You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akwa adaala na Miami
Mgbe e biputara ya
Otu akwa di na mahadum akpọrọ Florida International University na bekee nke mba Amerike adaala.
Akụkọ na-ekwu na akwa nke a dakwasịrị mmadụ ole na ole mana ọnụọgụgụ nke ezie apụtabeghị.
Ndị ọrụ nzọpụta na-arụ ọrụ ugbu a ịzọpụta ndị na no-okpuru akwa a.
Ha na-arịọ ndị mmadụ ka ha sị okporo ụzọ ọzọ na-aga ebe ha na-aga.
Ọ bụ ndị ụmụakwụkwọ na-aga mahadum Florida bụ ndị riọ arịrịọ ka ha rụọ akwa nke a maka n'ime ọnwa ọgọstụ n'afọ 2017 otu nwaakwụkwọ ibe ha nwuru mgbe ọ na-achọ ị gafe ụzọ a.
Akụkọ ka nna-abia.