Atiku na Amaechi ga-ama aka na ntuliaka imeụlọ pati ADC maka ịzọ ọkwa onyeisiala

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Onye bụbu osote onyeisiala Naịjirịa na onye bụbu minista na-ahụ maka njem na Naịjirịa nakwa otu onye rụburu ọrụ n'ụlọakụ bụ mmadụ atọ e kwupụtara na ha ga-ama aka na ntuliaka imeụlọ nke pati African Democratic Congress (ADC).

Atiku Abubakar, Rotimi Amaechi na Mohammed Hayatu-Deen ga-ama aka dịka pati ADC ga-ahọpụta onye ga-eji ọkọlọtọ pati ha zọọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka Naịjirịa ga-eme n'afọ 2027.

N'agbanyeghị na ADC bu ụzọ tụlee ịnabata usoro iwepụta otu onye mmadụ niile ga-akwado, ugbu a pati ahụ ga-aga n'ihu ime ntuliaka imeụlọ n'ihi na akụkọ kwuru na o nweghị onye chọrọ iwezuga onwe ya na ntuliaka ahụ.

Cheta na Atiku Abubabar bụ onye zọburu ọkwa onyeisiala Naịjirịa ugboro ugboro, arụọla ọrụ dị mkpa n'ịgbalị ijikọta ndị na-agba gọọmenti mgba ọnụ n'okpuru pati ADC tupu ntuliaka nke afọ 2027.

Dịka ya na onye bụbu onyeisi ụlọomeiwu Sineti Naịjirịa bụ David Mark na onye bụbu gọvanọ Osun steeti bụ Rauf Aregbesola, na-arụkọ ọrụ — ndị bụzi onyeisioche mba na odeakwụkwọ mba nke pati ahụ — Atiku akwadola ịmepụta otu ndị ga-ama Onyeisiala Bola Tinubu aka na ntuliaka 2027.

Ọtụtụ ndị isi ndọrọ ndọrọ ọchịchị a ma ama a kọrọ na ha so na ndị otu ya gụnyere onye bụbu Ọkaiwu Ukwu nke Naịjirịa bụ Abubakar Malami, onye bụbu Gọvanọ Kaduna steeti bụ Nasir El-Rufai, onye bụbu minista Egwuregwu bụ Bolaji Abdullahi, na onye bụbu odeakwụkwọ nke gọọmentị naịjirịa bụ Babachir Lawal.

N'aka nke ọzọ, Chibuike Rotimi Amaechi bụbu aka chịrị Riva steeti bụkwa onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọzọ karaaka na-ama Atiku Abubabar aka na ntuliaka imeụlọ ADC a.

Amaechi bụkwa onye a mara dịka otu n'ime ndị malitere otu pati n'ọchịchị bụ All Progressive Congress (APC) ma bụkwa onye na-egosipụta onwe ya dịka onye nwereike iweghachi ntụkwasị obi ọhanaeze n'ọchịchị Naịjirịa.

Onye nke atọ bụ Mohammed Hayatu-Deen, na-egosipụta onwe ya dịka onye teknụzụ nwere ahụmịhe iji merie nsogbu akụnaụba na ọchịchị Naịjirịa.

Onye ọkachamara n'ihe gbasara akụnụba dị afọ iri asaa na abụọ ekwuola ugboro ugboro na Naịjirịa chọrọ ọchịchị lekwasịrị anya n'ikike, ọzụzụ na amụma ndị mmadụ nọ.

Onye bụbu onyeisi ụlọọrụ FSB International Bank Plc lekwasịrị anya na iweghachi akụnaụba, ọrụ ndị ntoroọbịa, na mgbanwe ụlọọrụ - okwu ndị o kwuru dị oke mkpa bụ iji dozie ihe isi ike na enweghị ntụkwasị obi nke mba ahụ.

ADC ewepụtala oge ha ga-eme ntulịaka, họpụta ndị ga-azọrọ ha ọkwa n'afọ 2027

Otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'African Democratic Congress (ADC) ewepụtala oge ha ga-eme ntulịaka, họpụta ndị ga-azọrọ ha ọkwa dị icheiche n'afọ 2027.

ADC mere ka a mata nke a n'akwụkwọ ozi odeakwụkwọ ha bụ Bolaji Abdullahi binyereaka n'ụbọchị Sọnde.

Dịka akwụkwọ ozi ahụ si kwuo, ADC ga-amalite ire akwụkwọ ikike ịzọ ọkwa ọchịchị bido n'abalị ise nke ọnwa Mee ruo n'abalị iri nke ọnwa Mee, 2026.

Ha tinyere abalị iri na otu, nakwa abalị iri na atọ dịka ụbọchị ndị zụtara akwụkwọ ikike ịzọ ọkwa ọchịchị ga-enwechita ya azụ dịka ha tinyechara ndekọ ha.

N'abalị iri na anọ ruo abalị iri na ise nke ọnwa Mee bụ ụbọchị a ga-eme nnyocha n'isi ndị zụtara akwụkwọ ikike ịzọ ọkwa na Patị ha; ebe Mee 18 na Mee 19, 2026 bụ ụbọchị ndị nwere okwu maka ndị chọrọ iji Patị ha zọọ ọkwa ga-enwete ozi ha mkpesa, mana Mee 20 bụ ụbọchị a ga-enwepụta ahụ ndị niile ga-azọrọ ha ọkwa.

Ihe ọzọ gbara ọkpụrụkpụ ADC kwuru bụ ego ndị chọrọ ịzọ ọkwa ga-akwụ maka akwụkwọ ikike.

Ego ele ha ga-akwụ gụnyere:

  • Ọkwa Onyeisiala - Narị nde naịra "N100,000,000
  • Ọkwa Gọvanọ - Nde naịra Iri ise "N50, 000,000"
  • Sịneti - Nde naira iri abụọ "N20, 000,000"
  • Ụlọ omeiwu nta – Nde naịra iri "N10,000,000".
  • Ụlọ omeiwu steeti – Nde naịra atọ "3,000,000".

ADC na-eme nnukwu ọgbakọ ha n'agbanyeghị esemokwu banyere onye bụ onyeisioche ha

Pati African Democratic Congress' nke David Mark nọ n'isi ya, ekwuola na nnukwu ọgbakọ ha ga-aga n'ihu n'agbanyeghị esemokwu nakwa nsogbu inweta ogige ha ga-anọ mee ọgbakọ ahụ.

Ọgbakọ a na-abịa dịka a na-atụ anya mkpebi ụlọikpe mkpegharị banyere arịrọ David Mark n'akwụwkọ ikpe ọ gbara megide ikpe banyere onye bụ onyieisioche ADC.

Cheta na Nafiu Bala kpụpụrụ ADC n'ụlọikpe ma kwuo na ọ bụ ya kwesịrị ịbụ onyeisioche pati ahụ.

Esemokwu ahụ bụ ihe mere ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Inec) jiri kwuo na ha agaghị ahụta David Mark maọbụ Nafiu Bala dịka onyeisioche pati ADC ruo oge ụlọikpe kpebiri ikpe ahụ.

Ọ bụ mkpebi a mere ọtụtụ ji na-ajụ ka ụlọọrụ Inec a ga-anabata mpụtara nnukwu ọgbakọ a maka na ha kwuru na ha agaghị anabata David Mark na ndị ọrụ NWC ọzọ.

Ladan Salihu bụ osote onyeisioche mgbasaozi maka nnukwu ọgbakọ aụ kwuru na ha nwere olileanya na ha ga-eweta mmeri na mkpebi ụlọikpe ahụ.

O kwuru na usoro Inec wepụtara a ga-eji mee ntuliaka afọ 2027, bụ ihe mere ha ga-eji ghara iche ka ụlọikpe kpebie ikpe ahụ tupu ha eme nnukwu ọgbakọ ha.

Nsogbu banyere ogige ọgbakọ ahụ

Nnukwu ọgbakọ a ADC ga-eme ga-akpotụ n'ogige Rainbow Events Center dị n'Abuja.

Nke a na-abịa dịka mịnịsta na-ahụ Maka FCT bụ Nyesom Wike nakwa gọọmenti etiti kwuru na ha achọghị ka nnukwu ọgbakọ ahụ gaa n'ihu.

Ladan Salihu kwuru na pati ADC degaara ụlọọrụ na-ahụ maka ogige Eagle Square dị n'Abuja ka ha nye ha ikike ime nnukwu ọgbakọ ahụ ebe ahụ mana ha ekweghị. Ọgara n'ihu kwuo na ọtụtụ ụlọ oriri na nkwari dị n'Abuja ekweghị ka ADC mee ọgbakọ ha n'ogige ha.

O kwuru na otu ụlọ oriri na nkwari ha kwụrụ ụgwọ, mechara nyeghachi ha ego ha ma kwuo na ADC agaghị eme ọgbakọ ha n'ogige ha.

Salihu kwuru na o doro ha any ana mịnịsta FCT na gọọmenti etiti Naịjirịa na-arụkọ ọrụ igbochi ADC ime ọgbakọ ahụ.

N'aka nke ọzọ, Nyesom Wike kwuru na enweghị oge ọbụla pati ADC ji detara ya akwụkwọ ka e nye ha ikike iji ogige Eagle Square mee nnukwu ọgbakọ ha.

N'okwu Wike "Enwghị onye ọbụla detaara anyị akwụkwọ inye ha ikike maka ogige ahụ, enweghị ihe ga-egbochi anyị inye ha ya makana anyị ji ogige enweta ego".

Ozi Atiku Abubakar wepụtara n'ụtụtụ Tuzde 14 Eprel, 2026, kwuru na ụlọọrụ Rainbow Events Centre kwuru na NDỊISI FCT gwara ha na a ga-anapụ ha ikike ha ma ha nye ADC ogige ha maka nnukwu ọgbakọ ha chọrọ ime.

Atiku Abubakar kwuru na ADC kwụrụ ụgwọ niile ha kwesịrị ikwọ ma kọwaa nay a amaghị ihe mere e ji chọọ igbochị ha ime nnukwu ọgbakọ ha n'udo.

Ihe a na-atụ anya n'ọgbakọ a

A na-atụ anya ndị delegate dị 3,000 ga-esi mpaghara Naịjirịa niile n'ọgbakọ ahụ a ga-eme na Rainbow Events Center Abuja.

Ọnụ na-ekwuru ADC bụ Bolaji Abdulahi kwuru na ọgbakọ ahụ abụghị ọgbakọ e ji eme nhọpụta ndịisi ọhụrụ.

Nnukwu ọgbakọ di etu a, bụ oge pati ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọbụla ji agbakọ ma nwee nkwekọrịta banyere ihe ụfọdụ na pati ha.

Bolaji kwuru na nnukwu ọgbakọ a bụ iji nye ohere ka ndị delegate ilebanye anya n'ihe ụfọdụ mkpebi ndịisi pati kpebiri.

A na-atụ anya na ADC ga-eji ohere ọgbakọ a gwa ndị nkwado ha niile na Naịjirịa gbaa gburugburu atụmatụ ha ji aga na ntuliaka afọ 2027 dịka pati dị iche iche ga-amalite ime ntuliaka ime ụlọ iji họpụta ndị ga-azọrọ ha ọkwa n'ime otu izuụka na-abịa dịka ntuziaka usoro Inec wepụtara si kwuo.