You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Onyeisiala Tinubu ejirila vootu dị nde 10.9 merie ntuliaka imeụlọ APC
Onyeisiala Bola Tinubu emeriela ntuliaka imeụlọ pati All Progressives Congress mere n'ụbọchị Satọde 23 Mee, 2026 iji họpụta onye ga-eji ọkọlọtọ ha zọọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2027.
Onyeisioche hụrụ maka ntuliaka imeụlọ bụ Pius Anyim kwuputara mpụtara ntuliaka ahụ n'ụbọchị Sọnde Mee 24, 2026 n'ogige Bola Ahmed Tinubu International Conference Centre dị n'Abuja.
Anyim kwuru na Onyeisiala Tinubu ji vootu dị 10,999,162 merie Stanley Osifo nwetere vootu 16, 503 na ntuliaka ahụ e mere na wọọdụ dị 8,809 n'okpuru ọchịchị 774 dị na Naịjirịa.
Onyeisioche pati APC nọrọ na mmemme ahụ nye Onyeisiala Tinubu akwụkwọ asambodo mmeri ya ma nyekwa ya ọkọlọtọ pati APC.
Ka ọ dị ugbua, Onyeisiala Bila Tinubu bụ onye ga-eji ọkọlọtọ APC zọọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka a ga-eme n'afọ 2027.
N'okwu ya, Onyeisiala Tinubu kelere ndị otu pati APC nnile maka nkwado ha nyere ya iji bụrụ onye ga-azọrọ APC ọkwa onyeisiala n'afọ 2027.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Kaduna, Riva, Kano, Borno na steeti ndị ọzọ Onyeisiala Tinubu meriri na ntuliaka ime ụlọ APC
Onyeisiala Bola Tinubu enwetala nkwado dịka onye ga-eji ọkọlọtọ pati All Progressive Congress (APC) zọọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka Naịjirịa ga-eme n'afọ 2027.
Tinubu nwetara nkwado a dịka o meriri na ntuliaka ime ụlọ nke pati nọ n'ọchịchị bụ APC mere na mpagahara Naịjirịa niile n'ụbọchị Satọde abalị 23 nke ọnwa Mee 2026 dịka ha na-ejikere isonye na ntuliaka 2027.
Dịka pati ahụ si kwuo, e mere ntuliaka ahụ n'otu oge n'ofe mpaghara 8,809 n'ofe mba ahụ n'etiti Onyeisiala Bola Tinubu na nwaamdị aha ya bụ Stanley Osifo mana ọ bụ Tinubu ka ekwupụtara dịka onye meriri n'ụzọ na-atụghị anya, nke a mere ka ọ bịaruo nso n'ebumnobi ya ịlọghachi dịka onyeisiala Naịjirịa n'afọ na-abịa.
Onyeisiala Tinubu na nwunye ya bụ Sinetọ Oluremi Tinubu tụrụ vootu nke ha na Legọs ebe ndị otu pati APC gụnyere ndị gọvanọ, ndị omeiwu, ndị ọrụ gọọmenti na ndị isi sonyekwara na ntuliaka ahụ na ọtụtụ steeti ndị ọzọ.
A ga-enye Onyeisiala Tinubu asambodo nlaghachite
Ka ọ dị ugbu a, a ga-enye Onyeisiala Tinubu asambodo nlaghachite maka iji ọkọlọtọ pati APC zọọ ọkwa onyeisiala ọzọ n'afọ 2027.
N'ozi nke onye ndụmọdụ pụrụ iche ya wepụtara, ka o kwuru na ọ bụ taata bụ Sọnde abalị 24 Mee ka a ga-enye Tinubu asambodo nlaghachite ahụ.
Bayo Onanuga kwuru na Kọmitii na-ahụ maka ntuliaka ime ụlọ nke pati APC ga-enye Tinubu asambodo na ọkọlọtọ n'ụlọ nzukọ mba ụwa nke Bola Ahmed Tinubu dị n'Abuja mgbe a chịkọtara mpụtara ntuliaka ime ụlọ ahụ.
O kwuru na ndị gọvanọ APC, ndị otu kọmitii dị iche iche tinyere ndị isi otu pati, ga-abịa emume ahụ.
Kedụ steeti Onyeisiala Tinubu meriri na ntuliaka ime ụlọ APC?
Onyeisiala Tinubu bụ onye e kwupụtara na ọ bụ turuugo mmeri na ntuliaka ime ụlọ APC na steeti dị iche iche na Naịjirịa.
Steeti ndị o meriri na vootu ole o jriri meri gụnyere:
Na Riva steeti, Onyeisiala Tinubu nwetara vootu 280,468, ebe onye na agba ya ụkwụ bụ Stanley Osifo, enwetaghị vootu ọ bụla n'ime kansụl niile a tụrụ vootu.
Na Kaduna steeti, ọnọdụ ahụ yiri nke ibe ya, ebe ndị otu APC kwadoro ya n'otu olu dịka onye ga-azọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2027.
N'Akwa Ibom, Tinubu nwere vootu 389,197 n'ime ntuliaka emere n'ofe okpuru 329 nke steeti ahụ, ebe ogbo ya Osifo enwetaghị vootu ọ bụla.
Na Kogi steeti, Onyeisiala Tinubu nwetara vootu 197,370 iji merie Osifo, onye enwetaghị vootu ọ bụ la na steeti ahụ.
N'Ogun steeti, e kwupụtakwara Tinubu dịka meriri na ntuliaka ime ụlọ APC na steeti ahụ dụka o nwetara vootu 322,485 ebe Osifo enwetaghị vootu ọ bụla.
Na Bayelsa, Tinubu nwetara vootu 277,000 dịka o merikwara na steeti ndị ọzọ gụnyere Kano, Borno na steeti ndị ọzọ.
Uzodimma, Kalu, Okowa na ndị ọzọ meriri maọbụ daa ntuliaka ime ụlọ APC maka Ụlọomeiwu Sinetị
Ọtụtụ ndị na-achị steeti dị iche iche na Naịjirịa, ndị omeiwu na ndị chịburu dịka gọvanọ esonyela na ndị zọrọ ntuliaka ime ụlọ nke pati All Progressive Congress (APC) mere n'ụbọchị Mọnde abalị 18 Mee 2026 iji họpụta ndị ga-anọchite mpaghara ha n'Ụlọomeiwu Ukwu Naijiria.
Dịka ọtụtụ ndị pụtara na ntuliaka ahụ enweghị ndị gbara ụkwụ, ụfọdụ ndị ọzọ nwere ndị siri ike ha na ha zọrọ oghere iji ọkọlọtọ pati APC zọọ ọkwa onye omeiwu nke ụlọomeiwu Ukwu Sinetị.
Ka ọ dị ugbu a, ndị a ma ama nwetela mmeli na ntuliaka ahụ ebe ndị ọzọ dara ntuliaka ime ụlọ ahụ nke pụtara na ha agaghị ensonye na ndị ga-eji ọkọlọtọ pati APC zọọ ọkwa.
Kedụ ndị a ma ama nwetara mmeri?
Aka na-achị Imo steeti bụ Gọvanọ Hope Uzodimma na aka chịburu Abịa steeti bụ Orji Uzo Kalụ so na ndị meriri ntuliaka ime ụlọ pati APC nke pụtara na ha ga-eji ọkọlọtọ pati ahụ zọọ ọkwa onye omeiwu na ntuliaka 2027.
Uzodimma meriri aka chịburu steeti ahụ steeti ahụ bụ Rochas Okorocha na ntuliaka maka mpaghara Imo West.
Ndị ọzọ meriri na ntuliaka ahụ gụnyere Yahaya Bello chịburu Kogi steeti, Ifeanyi Okowa chịburu Delta steeti na onyeisioche ụlọomeiwu Sinetị bụ Godswill Akpabio.
Ọzọ, aka chịburu Edo steeti bụ Adams Oshiomhole, Ede Dafinone, Ali Ndume na onye bụbu onyeisioche ụlọomeiwu Sinetị bụ Ahmad Lawan nwetekwara ikike iji ọkọlọtọ APC zọọ ọkwa ndị omeiwu na ntuliaka ahụ.
Aka na-achị Ogun steeti bụ Dapo Abiodun nwetekwara mmeri ịzọkwa ọkwa na ntuliaka ahụ.
Olee ndị dara ntuliaka ime ụlọ ahụ?
Onye omeiwu a ma ama bụ Ned Nwoko dara ntuliaka ime ụlọ dịka Ifeanyị Okowa meriri ya, Rochas Okorocha dara ntuliaka ime ụlọ ebe onye omeiwu Neda Imasuen dara ntuliaka ime ụlọ Edo South dịka Omoregie Ogbeide-Ihama meriri ya.
Ntuliaka imeụlọ APC etinyela ndị Gọvanọ, na ndị ji ọkwa Sinetọ n'asọmpi onye ga-eje Abuja
Ụfọdụ ndị gọvanọ na-achọ ịpụ apụ n'ọkwa na ndị chiburu dịka gọvanọ so na ndị na-azọ ohere ife ọkọlotọ otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị All Progressives Congress (APC) na ntuliaka ịnọchite mpaghara ha n'Ụlọomeiwu Ukwu Naijiria.
Aka chịburu Delta Steeti bụ Ifeanyi Okowa bụ onye si otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Peoples Democratic Party (PDP) banye APC n'afọ 2025, na-azọsara Senetọ Ned Nwoko ohere iji ọkọlọtọ APC zọọ ọkwa nnọchịtaanya Delta-Central n'Ụlọomeiwu Ukwu n'Abuja.
Akụkọ na-efegharị na soshal midia gosiri na ndị pụtara ịtụnyere Okowa dị ọtụtụ n'ọnụọgụgụ, ebe naanị mmadụ ole ma ole bịara ịkwụnyere Nwoko.
Mpụtara ntuliaka apụtabeghị mana onyeisi otu achụmtavootu Nwoko bụ Ekene Kerry, boro ebubo ụbochị Monde na e nwere "ndị ọrụ gọọmentị steeti ahụ gbara isi akwara ịhụ na uche ndị mmadụ emezughị".
N'Imo steeti
Maka mpaghara ụfọdụ n'Ụlọomeiwu Ukwu ụfọdụ, ndị pụtara ịzọ enweghị ndị ha na-ama aka, ebe ụfọdụ bụ ọgụ na mgba na mpaghara ha.
N'Imo steeti, Gọvanọ Hope Uzodimma nakwa Aka chịburu steeti ahụ bụ Sinetọ Rochas Okorocha, na Sinetọ Osita Izunaso na-achịpụ ya na ndọrọ ndọrọ onye ga-efe APC maka ọkwa ị nọchite Imo-West n'Ụlọọmeiwu Ukwu.
Mmadụ atọ a bụ ndị nọ n'ọkwa ugbua maọbụ chịburu mbụ na-azọ onye ga-alaghachi.
Hope Ụzodimmma bụ gọvanọ na-achị Imo steeti ugbua. Rochas Okorocha chịrị steeti ahụ, na Osita B. Izunaso bụ onye ji ọkwa Sinetọ na-anọchite Imo West (Orlu) kemgbe ọnwa Juun afọ 2023 na-azọ isi onwe ha.
N'Abia steeti
Aka chịburu Abia steeti bụ Senetọ Orji-Uzor Kalu na Philip Nto chịpụrụ ya na ntuliaka imeụlọ ifere APC ọkọlọtọ maka ọkwa ịnọchite Abia North n'Ụlọomeiwu Ukwu.
N'Enugu Steeti
Ikeje Asogwa na Dr. Ugo Ugwuanyi zọrọ ọkwa onye ga-efe ọkọlotọ APC nọchiteanya Enugu-North n'Ụlọimeiwu Ukwu.
N'aka nke ọzọ, Senetọ Kelvin Chukwu bụ onye ekwekọrịtara ka o feere pati ahụ ọkọlọta ha maka a họrọ as its flagbearer