Ụlọikpe atụọla ndị ekweghịekwe na Kameroon mkpọrọ

Mancho Bibixy
Nkọwa foto, Mancho Bibixy tupu anwụchịe ya
Mgbe e biputara ya

Otu ụlọikpe dị na Kameroon amala mmadụ asaa so na ndị ekweghịekwe na mba ahu ikpe na ha bu ndị oyi egwu bụkwara ndị chọrọ nkewa.

Ndị ihe a metụtara gụnyere Mancho Bibixy, bubu onye ntaakụkọ na radio na mpaghara Kameroon na-asụ Bekee, na mmadụ isii ọzọ.

Ndị a ga anọ mkpọrọ site afọ iri rue afọ iri na ise.

Ndị na-asụ Bekee na Kameroon bidoro emume ekweghịekwe n'afọ 2016 ka ha na-ekwu na ndị si na mpaghara Kameroon na-asụ Frenchị na-emekpa ha ahụ, ma na-egbọchịrị ha ụzọ ọganihu.

Ekweghịekwe a mechara bụrụ ihe yiri agha, bukwa nke butere ogbugbu mmadụ.

Mmadu puku na puku gbagara Naịjirịa ka ndị nchekwa Kameruun ji aka ike eso ndị a na-acho inwere onwe ya.

Akara ntụ-ntụ
Akara ntụ-ntụ