Accident: Nne adagbuola nwa ọhụrụ ya

Mgbe e biputara ya

Nwaanyị hụrụ nwa ya n'anya enwereike ịdagbu ya?

Ndị ọrụ ụlọọgwụ akpọrọ Cork University Maternity Hospital chọpụtara ozu nne na nwa nọ n'okpuru ya mgbe ha na-eme ngagharị nyocha wọọdụ.

Akụkọ na-ekwu na achọtara nne ahụ dị afọ iri atọ na nwa ya n'ala n'imeụlọ ụlọọgwụ ahụ.

Ndị ọrụ ụlọọgwụ ahụ gbara mbọ inye nwa ọhụrụ ọgwụgwọ gbatagbata mana o mechara nwụọ.

A na-eche na nwaanyị a si n'elu akwa ya dapụ dagbuo nwa ya mgbe onwere nsogbu ahụike ka o na-enye ya ara.

A ga-amalite nyocha ozu nne na nwa, ka -achọpụta ihe mere ha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: