Eastern Palm University: Okorocha agbarụọla ihu maka ije gọọmentị Imo na mahadum ya

Mgbe e biputara ya

Owelle Rochas Okorocha bụ aka chịbụrụ Imo steeti agbarụọla ihu maka akụkọ na gọọmentị Imo steeti naghara ya mahadum 'Eastern Palm University.'

Okorocha ji ohere ozi o zipụtere rịọ ka gọọmentị chee echiche ọfụma tupu ha zọpụ ije gbasara mahadum ahụ.

Ebere Nzewuji bụ onye nnyemaka mgbasaozi Okorocha kwuru na gọọmentị Imo steeti emeghị ọfụma chaa chaa.

Ọ sịrị,"Gọọmentị Imo kwesiri ịnyocha mahadum ndị ahụ tupu ha amachie ya"

Okwu a na-abịa dịka kọmitii nke Emeka Ihedioha kpokọbara mak iwetakwa ihe gọọmenti furu efu kwuru na e kwesiri inyeghachi mahadum ahụ n'aka gọọmentị

Ha kwuru na o doro anya na ọ bụ ego gọọmentị ka eji rụọ ya bụ mahadum Eastern Palm University mbụ n'ihi na ọ bụ gọọmentị Imo zụrụ ala ebe a rụrụ ya.

Ọnụ na-ekwuchitere Emeka Ihedioha bụ Steve Osuji gwara BBC Igbo na o nwebeghi ihe gọọmentị mere maka nchọpụta a.

O kwuru na kọmiti ahụ lebara anya na mahadum na politeknik niile Okorocha hibere tupu ọ pụọ n'ọchịchị.

N'ọnụ ya "Gọọmentị ka natara mpụtara Kọmitii ahụ nyere ụnyaahụ, o nwebeghi ihe ha kwuru maọbụ mee gbasara ya."