Ofala festival: Taa ka Igwe Achebe pụtara n'ebube ya gbaa egwu Ọfala

Mgbe e biputara ya

Taa ka emume Ọfala nke iri na asaa nke Obi Ọnịcha bụ Alfred Achebe malitere n'uju.

Ọfala bụ nnukwu emume n'ala Igbo, tụmadị n'Anambra.

Ọ bụ emume nke eze obodo ji egosi ndị ọ na-achị onwe ya kwa afọ.

Ndị obodo na-ejikwa emume a ekwuputa nkwenye ha na irube isi ha nye eze ha.

Eze ndị obodo dị ịche n'Anambre steeti na-agba ọfala, mana ọbụ nke ndị Ọnịcha kacha ada ụda.

Onye bụ Nnaemeka Achebe?

Igwe Nnaemeka Achebe bụ Obi nke iri abụọ n'otu nke Ọnịcha.

E chiri ya Obi nke Ọnicha n'ọnwa May 2002.

Aha otutu ya gunyere Agbogidi, Enyi, Agu, Ọkara mmadụ ọkara mmụọ, Mkpu, wee dịrị gaba.

A mụrụ Achebe n'onwa May afọ 1941.

Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Columbia nke dị na New York na mba Amerịka.

Mgbe ọ lọghachiri Naịjirịa n'afọ 1972, ọ malitere ọrụ n'ụlọọrụ na-emepụta Mmanụ Agbidi bụ Shell Petroleum Company.

Achebe rụgidere na Shell ruo mgbe ọ lara ezumike nka n'afọ 1995.

Mgbe ọ nọ na Shell, ọ rụrụ ọrụ dịka otu n'ime ndị isi ụlọọrụ ahụ na mba Angola, Ghana, UK, Liberia, Netherlands, Nigeria, Sierra Leone, nakwa The Gambia.

Kedu mgbe Ọfala malitere?

Ọ bụ mkpụrụokwu abụọ: ọfọ na ala, ka e ji mepụta okwu a bụ ọfala.

Nke a gosipụtara na ọbụ eze obodo ji ọfọ nke obodo ahụ.

Akụkọ kọrọ na Ọfala malitere mgbe gboo gboo.

N'oge ahụ, ọ bụ naanị ma Igwe na-agba ọfala ka ndị nkịtị n'obodo ji ahụ ya anya.

Mdị mmadụ na-eji oge emume a akwanyere Igwe ugwu pụrụ iche, ebe Igwe na-enyekwa ha ngọzị.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: