Soludo Inauguration: Ebele Obiano arịọla mgbaghara ma kwupụta ebumnobi ya ịzọ ọkwa sịnetọ

Mgbe e biputara ya

Ebelechukwu Obiano bụ nwunye gọvanọ chiburu Anambra Steeti bụ Willie Obiano arịọla mgbaghara maka esemokwu dapụtara n'etiti ya na Bianca Ojukwu na 17 Maachị, 2022 mgbe a na-edu gọvanọ Chukwuma Soludo n'iyi ọrụ n'Awka.

Obiano rịọrọ mgbaghara ahụ mgbe ọ na-ekwupụta ebumnobi ya ịzọ ọkwa Sịnetọ ga-anọchi anya Anambra North n'Ụlọomeiwu Ukwu n'Ọka n'ụbọchị Wenezde.

Ọkwa sịnetọ mpaghara Anambra- North ọ na-akwadọ ịzọ dị n'aka onye bụbu minista njem ụgbọelu. bụ Seịnetọ Stella Oduah nke pati PDP ugbua.

Otu n'ime ndị enyemaka aka ya bụ Obika Chidiebere gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na nne ya ukwu kwupụtara uche n'ịzọ ọkwa ahụ.

Ihe Ebele Obiano rịọrọ n'arịrịọ

Obiano sị na ọ rịọla gọvanọ Chukwuma Soludo na-achị Anambra ugbua mgbaghara maka esemokwu ahụ mere n'ụbọchị a na-edu ya n'iyi ọrụ.

Ọ sị na o mere nke a site n'idegara Soludo akwụkwọ ozi.

O kwuru "Dịka onye udo nke e ji maara m, ọgbaghara abụghị akwa m,"

"Ekelere m ndị okenye, ndịisi ọchịchị, ndị enyi na ndị Anambra niile ndị kpọrọ m ma gosi nwute ha n'ihe ahụ mere ma nye ma ndụmọdụ."

"Ndị maara nke ọma ma na kemgbe afọ asatọ m bụ nwunye gọvanọ, na agbasoro m ụzọ udo na inyere ndị mmadụ aka."

"O nweghi ihe m ga-eji kụnye aka maka mmechu ihu ahụ, na-agbanyeghi ihe ọbụla e mere m."

"N'otu aka ahụ, ana m arịọ ndị gbapụtara ihe niile, ndị Anambra nakwa ndị Igbo mgbaghara maka imechu ha ihu n'emume ahụ."

Ihe mere Ebere Obiano ji pụta ịzọ ọkwa Sịneti

Mgbe Ebele Obiano na-ekwupụta ihe mere o jiri chọrọ ịzọ ọkwa Sịnetọ n'afọ 2023 n'Ọka, ọ sị na ọ bụ uche Chineke na ọ ga-azọ ọkwa ahụ.

N'okwu ya "Ebumnobi m ịzọ ọkwa a si n'ọkpụkpọ oku ndị obodo m kpọrọ m ka m nọchiteanya ha n'Ụlọomeiwu Etiti.

"Ndị Anambara anwaala ma ma chọpụta na e nwere m mmasị n'ijere ndị mmadụ ozi, igosi ịhụnanya nakwa itinye ọchị n'ihu ndị obi na-adịghị m, a maara m na ọ bụ uche Chineke."

"Ọ bụ ihe ndị a mere ndị nke m jiri kpebie ma sị ka m bịa jeere ha ozi n'ebe ọ dị ukwuu".

Obiano bụ onye pati APGA bụ pati di ya jiri zọọ ọkwa ma merie dịka gọvanọ Anambara Steetị n'afọ 2014 ruo afọ 2022 ọ rịturu n'ọchịchị.

O dobeghi anya ma ọ gbatala akwụkwọ ikike igosi mmasị ya n'ọkwa ahụ nke a kpọrọ 'normination form'.

Ị maara onye bụ Ebele Obiano?

  • Ebelechukwu Obiano bụ nwunye Willie Obiano bụ aka chiburu Anambra Steeti
  • A mụrụ ya n'Ọnịcha, Anambra steeti
  • Ọ bụ onye obodo Ifite, Ogbunike dị n'okpuruọchịchị Oyi dị n'Anambra steeti, ma lụọ Obiano bụ onye Aguleri nke Anambra North
  • Ha mụrụ ụmụ abụọ, otu nwaanyị na otu nwoke
  • Ọ gụrụ akwụkwọ sekọndịrị na Legọs nakwa Okija ma gụọ mahadum na mahadum Legọs
  • Ọ gụkwara akwụkwọ na Houston, Texas dị na mba Amerịka
  • Ọ rụọla ọrụ n'ọtụtụ ebe gụnyere ngalaba NNPC a kpọrọ NAPIMS
  • O hiwere ụlọọrụ na-ahụ maka inyere ndị mmadụ aka a kpọrọ 'Caring Family Enhancement Initiative' (CAFE) n'afọ 2014

Akụkọ ndị ga-amasị