You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ademola Adeleke emerila ntuliaka ọkwa gọvanọ Osun steeti
Gọvanọ Ademola Adeleke nke pati Accord eturula ugo na ntuliaka ọkwa gọvanọ Osun steeti e mere n'ụbọchị Satọde 15 Ọgọst, 2026.
Joshua Ogunwole bụ onye rụrụ ọrụ dịka onye chịkọtara mpụtara ntuliaka ahụ kwuru na Gọvanọ Adeleke ji vootu 511,067 merie na ntuliaka ahụ.
Bola Oyebamiji nke pati All Progressive Congress (APC) nwetere vootu 444,815 iji gbaa onye nke abụọ ebe Najeem Folasayo Salaam nke pati di African Democratic Congress (ADC) bụ naanị vootu 17,180 ka o nwetere.
Vootu a tụrụ na ntuliaka a e mere n'okpuru ọchịchị iri atọ (30) nke steeti ahụ dị 1,005,80 ebe vootu a gụrụ dị 9,850,79. E nyochara mmadụ dị 1,010,684 maka ịtụ vootu na ntuliaka.
Ka ọ dị ugbua, Gọvanọ Adeleke ga-aga n'ihu chịa Osun steeti dịka gọvanọ nke ugboro abụọ ya.
Osun State election result: Etu mkpụtara ntuliaka ọkwa Gọvanọ steeti ahụ si kwụrụ
Gọvanọ Ademola Adeleke meriri n'ọnụama ebe ọtụrụ vootu
Gọvanọ Osun steeti bụ Ademola Adeleke emeriela n'ọnụ ama ebe ọ nọ tụọ vootu bụ 'Unit 009' dị n'ụlọ Abogunde.
Ọnụ ama ebe ahụ dị na wọọdụ 02, Sagba dị n'okpuru ọchịchị Ede Nọt.
Gọvanọ Adeleke nke pati Accord nwetere vootu 421, ebe onye nke APC nwetere vootu 29.
Mara na Adeleke dịka gọvanọ na-achị steeti ahụ na-azọ ọkwa ahụ ọzọ ka o nwee ike ịchị steeti ahụ nke ugboro abụọ.
Na mpaghara dị icheiche n'Osun steeti ugbua, ndị ọrụ INEC ebidola mkpọpụta mpụtara ntuliaka ọkwa Gọvanọ n'ama ebe a nọ tụọ vootu.
Cheta na a gụchaa ma kpọpụta mpụtara vootu n'ama ebe niile a nọ tụọ vootu, e mechaa a ga-eje n'isi ụlọọrụ INEC dị na steeti ahụ bụ ebe a ga-agbakọ ma kpọpụtakwa ndekọ niile si n'ama n'ama dị na gọọmenti okpuru ọchịchị iri atọ ha were.
Gọvanọ Ademola Adeleke akpọọla oku udo
Gọvanọ Ademola Adeleke na-achị Osun steeti akpọkuola onyeisi ndị uweojii Naịjirịa bụ Olatunji Disu ka ọ hụ na e mere na ntuliaka ọkwa gọvanọ steeti ahụ n'ụzọ iwu kwadoro.
Gọvanọ Adeleke nke pati Accord kpọrọ oku a oge ọ tụrụ vootu ya na na wọọdụ 2 dị n'okpuru ọchịchị Ede Nọt n'ụbọchị Satọde 15 Ọgọst 2026.
O kwuru na ndị Osun steeti achọghị ọgbaaghara ọbụla na ntuliaka a ma kwuo ka ndị uweojii rube isi nye iwu banyere etu e si ebuga akwụkwọ e ji mee ntuliaka ahụ.
Gọvanọ Adeleke kwuru na akwụkwọ ntuliaka a ga-ebu ụzọ gaa wọọdụ, gaa okpuru ọchịchị tupu e buru ya gaa n'isiobodo steeti.
Najeem Salam nke pati ADC atụọla vootu ya
Najeem Salam ji ọkọlọtọ African Democratic Congress (ADC) azọ ọkwa gọvanọ n'Osun steeti atụọla vootu ya na wọọdụ 04 n'okpuru ọchịchị Ejigbo na ntuliaka ọkwa gọvanọ Osun steeti na-aga n'ihu na steeti ahụ n'ụbọchị Satọde 15 Ọgọst, 2026.
Onyeisiala Bola Tinubu agwala Inec ka ha ghara ime chandum
Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu agwala ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Inec) na ndị ọrụ nchekwa ka ha ghara ime chandum n'ụdịrị ọbụla na ntuliaka ọkwa gọvanọ Osun steeti a na-eme n'ụbọchị Satọde 15 Ọgọst 2026.
Onyeisiala Tinubu kwuru nke a n'ozi ọnụ na-ekwuru ya bụ Bayo Onanuga wepụtara ma kpọọ oku ka Inec hụ na ntuliaka a gara n'ụzọ iwu kwadoro.
Gọvanọ Ademola Adeleke atụọla vootu ya
Gọvanọ Osun Steeti bụ Ademola Adeleke atụọla vootu ya na ntuliaka ọkwa Gọvanọ na-aga n'ihu na steeti ahụ.
Gọvanọ Ademola Adeleke na nwunye ya tụrụ vootu ha n'obodo ya dị n'Ede.
A malitela ntuliaka ọkwa Gọvanọ Osun steeti
A malitela ime ntuliaka ọkwa Gọvanọ Osun steeti n'okpuru ọchịchị iri atọ (30) dị na steeti ahụ taa bụ Satọde 15 Ọgọst, 2026.
Ụlọọrụ Inec kwuru na ha e ji igwe Bimodal Voter Accreditation System (BVAS) dị 5,130 eme ntuliaka a. Nke a dị iche na ntuliaka ikpeazụ e mere na steeti ahụ nke ọ bụ igwe BVAS dị 4,427 ka e ji mee ya
Ọnụọgụgụ ndị debanyere aha ha ịtụ vootu bụ 2,339,233 n'ogige 3,763 dị na wọọdụ 332 nke steeti ahụ.
Ihe mere e ji eme ntuliaka a ugbua bụ maka na n'afọ 2007, ụlọikpe kagburu ntuliaka họpụtara Gọvanọ Olagunsoye Oyinlola n'agbanyeghị na ọ nọọla n'ọkwa afọ atọ ma tinye Rauf Aregbesola dịka Gọvanọ.
Ha malitere ịgụ oge Gọvanọ steeti ahụ n'ụbọchị Rauf Aregbesola banyere n'ọkwa.
Ọ bụ nke a mere oge e ji eme ntuliaka ọkwa Gọvanọ na steeti ahụ ji dị iche na steeti ndị ọzọ.
Pati ndọrọndọrọ ọchịchị 14 wepụtara mmadụ 14 ga-azọrọ ha ọkwa na ntuliaka a.
Onye ji ọkwa Gọvanọ bụ Ademola Adeleke nke Accord pati, Bola Oyebamiji nke pati All Progressive Congress (APC) na Najeem Folasayo Salaam nke pati di African Democratic Congress (ADC) nakwa ndị ọzọ.