Alaọmajiji Venezuela: Ọnụọgụgụ ndị nwụrụ arịala ruo 589

Ebe foto si, Getty Images
Ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'alaọmajiji abụọ mere na mba Venezuela arịala rue mmadụ 589, ebe mmadụ 2,980 merụrụ ahụ dịka onye na-arụ ọrụ dịka Onyeisiala bụ Delcy Rodríguez si kwuo.
Ka nke a na-eme, ndị gbatagbata sị mba ndị ọzọ gụnyere ndị si mba Swizaland na Meziko esonyela n'inyere ndị mmadụ ihe metụtrara aka.
Ọnụọgụgụ ndị nwụrụ arịala ruo 235

Ebe foto si, Screengrab
Ndị ọrụ gbatagbata ka na-achọ ụlọ dagara ada iji zọpụta ndị tọrọ dịka ọmajiji biri ọtụtụ ihe na mba Venezuela, gbuo o pekatampe mmadụ 235, ma merụọ mmadụ ruru 43000 ahụ.
Na Caracas bụ isobodo mba ahụ nakwa obodo La Guaira, ndị mmadụ na-anụ olu ndị tọrọ n'okpuru ala ka ha na-eti mkpu ka a bịa zọ[ppụta ha.
A na-eche na ndị nwụọrọla karịrị ọle agụrụola n'ọnụọgụgụ, ebe ọtụtụ enweghịzịkwa ụlọ, ebe ụfọdụ na-atụ egwụ ịnọ n'ụlọ ha.
Etu alaọmajiji si taa isi mmadụ 32, merụọ mmadụ 700 ahụ na Venezuela

Ebe foto si, Getty Images
Ihe karịrị mmadụ 32 anwụọla, ebe ọpekatampe mmadụ 700 merụrụ ahụ, mgbe oke alaọmajijiji abụọ kụrụ Venezuela n'akụkụ isi obodo ya, Caracas.
Dịka ndị ọrụ ụlọọrụ nnyocha alaọmajijiji nke Amerịka bụ 'US Geological Survey (USGS)' si kwuo, alaọmajijiji mbụ a mere, rụrụ ogogo 7.2, ebe nke abụọ na-erughị otu nkeji rụrụ ogogo 7.5.
Onye nọ dịka onyeisi ọchịchị mba Venezuela bụ Delcy Rodríguez, ekwupụtala ọnọdụ mberede na mba ahụ, ma ziga ndị ọrụ gbatagbata ka ha na-achọ ndị ka nọ n'okpuru ụlọ ndi dara ada.
Akụkọ kwuru na ọtụtụ ụlọ dara ada, ebe ụfọdụ mebiri nke ukwuu na Caracas na mpaghara ndị ọzọ. Ọdụụgbọelu mba ụwa nke Maiquetía mechiri emechi n'ihi mmebi ọ nwetara.
Ndịọrụ nnyocha kwuru na enwereike ịhụ ozu ndi mmadu na mmebi ndị ọzọ ka ọrụ nzọpụta na-aga n'ihu.

Ebe foto si, Getty Images
Alaọmajijiji ahụ metụtakwara ụfọdụ mpaghara mba Kolombịa, ebe ọtụtụ ndị bi na ya kwuru na ha nụrụ mkpọtụ na ịmajijiji ahụ.
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump, kwuru na Amerịka dị njikere inyere Venezuela aka n'ọrụ nzọpụta na mgbake.































