Ihe mere ụlọụka Anglican Nigeria jiri kwụsị Bishop Alexander Ibezim nke Awka Diocese ọrụ ruo ọnwa isii

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Onyeisi ụlọụka Anglican na Nigeria bụ Most Rev. Henry Ndukuba enyela ntuziaka ka ArchBishop nke mpaghara Niger nakwa Bishop nke Awka Diocese bụ Most Rev. Alexander Chibuzor Ibezim ka ọ gaa ezumike ọnwa isii n'ihi ebubo ndị e boro ya na nnyocha ndị na-aga n'ihu na Diocese ya.

Nke a dị n'akwụkwọ ozi ha wepụtara na 13 Ọktoba 2026 ebe Onyeisi Anglican kwuru na mkpebi si na ntuziaka otu e hiwere eleba anya n'ihe na-eme na Diocese ahụ, ọkachasị ndị si esi bata nke Dean ụka Anglican na Nigeria nọ n'isi ya.

Ozi ahụ kwukwara na mkpebi ahụ gbadokwara ụkwụ na nzukọ Primate na Bishop Ibezim nwere n'ụbọchị 9 Ọktoba 2026 bụ ebe a gwara ya maka mkpebi otu nnyocha ahụ.

O kwuru na nkwụsị n'ọrụ a bụ maka iji hụụ na e mere nnyocha kwụụ aka ọtọ n'ebubo ndị e boro Bishọp Ibezim, ma weghachite udo nakwa ịdị n'otu na Diocese ahụ.

Primate kwuru na mkpebi ahụ bụ nke ndịisi ụka mere na ọ bụghị ntaramahụhụ, gbagide ụkwụ n'iwu ụlọụka ahụ bụ 'Section 29(1) of Chapter V of the Constitution and Canons of the Church of Nigeria nke afọ 2020.

Ozi ahụ họpụtara Bishop nke Aguata Diocese bụ Rt. Rev. Samuel Ezeofor dịka onye nlekọta Awka Diocese nakwa Bishop nke mpaghara Niger n'oge e nyere Bishop Ibezim ezumike a.

E nyekwara Bishop Ibezim iwu ka o were ihe ọrụ ya niile nyefee n'aka Bishop Ezeofor ngwa ngwa ma sị ka ọ ghara ịghazi ofufe ọbụla maọbụ ihe ọbụla a na-eme na mpaghara Niger nakwa Awka Diocese dịka ọ nọ ezumike a.

Nkwụsị n'ọrụ ọnwa isii ahụ ga-adị ire mana e nwere ohere ileba ya anya gbatịkwuo maọbụ belata ya dịka Primate si kwuo.

Kedụ ebubo ndị e boro Bishop Ibezim?

N'ozi ahụ si n'aka Primate ụlọụka Anglican nke Nigeria, a kọwaghị kpọmkwem ihe bụ ebubo ndị e boro Bishop Ibezim mana ha kwuru na aha dị n'etiti ọtụtụ e bubo ndị aṅaa nke na-ebutere ụlọụka Anglican mmechu ihu.

Bishop Ibezim ọkpụpụrụ Primate Anglican n'ụlọikpe maka ịkwụsị ya ọrụ?

Kepukekpu na-efegharị na soshal midia na-ekwu na Bishop Alexander Ibezim akpụpụla Primate ụka Anglican bụ Rev. Henry Ndukuba na Dean nke ụka ahụ maka "ịkwụsị ya n'ọrụ n'ụzọ iwu na-akwadoghi".

Akụkọ kwuru na ọ gbara akwụkwọ n'ụlọikpe Ukwu dị n'Awka, Anambra State ma sị na a kpasịrị ya agwa ọjọọ, kwuo na ọ bụ ụlọikpe ka olileanya onye nkịtị nọ n'inwete ikpe ziri ezi.

O bokwara Primate na Dean ụka Anglican ebubo na ha chọrọ iwepụ n'ọkwa Bishop n'ike.