Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
NCC Approved Handsets: Lee ụdịrị ekwentị ise na-agaghịzi arụ ọrụ na Nigeria
- Onye dere ya, Bashir Zubairu Ahmad
- Ndị mere akụkọ a, Multimedia Journalist
- Ebeg o si, Abuja
- Mgbe e biputara ya
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3
Ụlọọrụ na-ahụ maka nziritaozi ekwenti bụ Nigerian Communications Commission (NCC) ekwupụtala etu enyocha ekwenti nakwa igwe mgbasaozi ndị mmadụ new na Nigeria ma kwuo na ha ga-amachi ụfọdụ ekwenti na-enweghi ikike ịrụ ọrụ n'obodo.
NCC gwara BBC na usoro ọhụrụ so n'atụmatụ ọhụrụ ha na-eme iji hụụ e ji ezi akụrụngwa na ekwentị ezirita ozi na Nigeria, nke ga-amalite n'Ọktoba 7, 2026 iji belata mfesasị ekwentị adịgboroja.
Ụlọọrụ a kwuru na ha chọrọ ime ka ekwentị niile a na-ere na Nigeria bụ nke ruru ogogo kwesịrị ekwesị ma chekwaa ndị na-eji ya aza oku.
Onye na-arụ maka inye ikike n'ụlọọrụ Nigerian Communications Commission (NCC) bụ Malam Usman Mamman, gwara BBC na "ọ bụghị ihe mbụ, NCC nwere iwu dị etu a".
Ihe NCC kwuru
Ụlọọrụ a nyere ndị mmadụ ndụmọdụ, ọkachasị ndị na-azụgharị ekwentị onye ọzọ jiturula, sị ka ha nyochaa ekwentị ahụ tupu ha akwụọ ụgwọ ya, ka ha ghara ịzụ ekwentị na-enweghi ikike ịrụ ọrụ na Nigeria.
"Ekwenti niile dị n'akwụkwọ anyị. Anyị na-enye ikike, ekwentị niile na-abata na Nigeria ka a ga-enyocha. Ọ bụghị iwu ọhụrụ," ka Malam Usman kwuru.
O kwuru na ha ezigarala ndị mmadụ akara pụrụiche iji chọpụta ma ekwentị o tuzuruoke ịrụ ọrụ na Nigeria.
Site n'akara ahụ onye ahụ ga-ama ma NCC o nyochaala ekwentị ya ma ọ bụghị ya ọ chọọ ụzọ nyochaa ya.
Kedụ ụdịrị ekwentị na akụrụngwa NCC ga-amachi?
NCC kwuru na ọtụtụ ekwentị a na-ebubata na Nigeria adịghị mma, ma ụfọdụ ndị na-anaghị azanwu oku.
Ha kwuru na ụfọdụ ekwentị ndị a nwereike ibute nsogbu nchekwa n'ọha nakwa ihe iyi egwu.
Lee ụfọdụ ekwentị ndị iwu a metụtara
- Smartphones: Ekwentị ọgbara ọhụrụ na-etozughi oke n'ogugu NCC agaghị enwe ikike ịrụ ọrụ na Nigeria.
- Basic Mobile Phones: Obere ekwentị ndị ji aza naanị oku maọbụ ezirita ozi so na ndị a ma ọ bụrụ ha etozughi oke.
- SIM-enabled Tablets and Laptops: Akụrụngwa 'Tablets', obere kọmputa 'laptop', ma 'iPad' na ndị ọzọ na-eji akara njirimaara bụ SIM card maka ịza oku ka a ga-amachi ma ọ bụrụ na ha etozughi oke.
- Internet of Things (IoT) Devices: Nke a bụ akụrụngwa ndị na-eji intanetị eziritaozi dịka 'routers.
SIM-enabled POS Devices: Nke a ga-emetụtakwa igwe POS e ji adọrọ ego n'ọbaego ma ọ bụrụ na ha etozughi oke ịrụ ọrụ na Nigeria.
Mana NCC bipụtara ozi na websaịt ha ma kwuo na e nweela ụdịrị ekwenti karịrị puku abụọ nweterela ikike ịrụ ọrụ na Nigeria.
Kedụ ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ ekwentị enweghi ikike
NCC kwuru na nke a abụghị iwu na ndị nwere ekwentị ga-agbanwe ma sị ha na e wepụtala ọtụtụ usoro ị ga-eji maara ma ekwentị ọ ga-arụnwu ọrụ na Nigeria nke gụnyere;
- Pịnye akara *315# n'ekwentị gị, ị gaghị akwụ ụgwọ.
Mpụtara ya ga-ezi gị ma NCC o nyochaala ekwentị gị, ọ bụrụ na ha emebeghi ya, a ga-enye gị ntuziaka etu ị ga-esi mee ya.
- Gaa n'ọbaozi websaịt ha bụ ncc.gov.ng.
Ị ga-ahụ ozi banyere etu I nwereike iji mata ma ekwentị gị o nwere ikike a.
- Kpọọ akara 622 n'ekwentị gị
Ha ga-akọwara gị etu ị ga-esi enyocha ekwentị gị maọbụ akụrụngwa ndị ọzọ.
A ga-amachi ekwentị na-enweghi ikike ma ụbọchị 30 gachaa
NCC kwuru na ha na-enye ndị nwere ekwentị na Nigeria ụbọchị iri atọ iji nyochaa ma ekwentị ha o nwere ikike ịrụ ọrụ na Nigeria, ekwentị ọbụla na-erughi ntozu oke NCC ma nwere nsogbu agaghị arụ ọrụ na Nigeria.