Flydubai cockpit: Onike ka e ji wakpo ọkwọụgbọelu si Dubai aga Israel

Ebe foto si, SCREENGRAB
Ọkwọụgbọelu Flydubai a wakporo n'ime ugboelu bụ Captain Smit Machchhar bụ onike ka e jiri wakpoo ya dịka a chọrọ ịnaghara ya ụgbọelu ahụ tinye ya isi ebe ọzọ, dịka onyeisi ikpe nke mba United Arab Emirates(UAE) si kwuo.
Ụgbọelu ahụ si Dubai aga Tel Aviv isiobodo Israel bu ihe karịrị mmadụ 170 dara ruo 17,000ft (5,200m) n'awa abụọ na ọkara njem ahụ malitere tupu ndị njem agbakọ aka jigidi onye mwakpo ahụ, ebe ndị ọkwọụgbọelu abụọ ọzọ weghara ọnọdụ ịkwọ ụgbọelu ahụ.
A na-enwe onike n' ngalba ebe ndị ọkwọụgbọelu na anọ maka ihe ntụmadị.
Ọkaiwu Ukwu nke mba UAE gwara ụlọntakụkọ nke mba ha na nnyocha na-aga n'ihu iji chọta ihe niile mere n'okwu ahụ nakwa ihe e bunobi mee ya.
Ekwechiiri m na agaghị ekwe ka ndị mmadụ nwụọ - ọkwọụgbọelu Flydubai a wakporo

Ebe foto si, India Embassy in Israel
Onye ọkwọụgbọelu Flydubai bụ Smit Machchhar, onye India bụ onye ogbo ya wakporo n'ime ụgbọelu, kwuru na ya gbasiri mbọ ike ịzọpụta ndị njem mgbe ọ chọpụtara na ụgbọelu ha na-adaba n'ala n'ike.
Machchhar kwuru na n'agbanyeghị na ọ merụrụ ahụ ma dina n'ala, o jiri ike ikpeazụ ya mepee ọnụ ụzọ cockpit ka ndị ọzọ nwee ike ịbanye nyere ya aka.
"Anọ m n'ala merụrụ ahụ, mana ama m na agaghị m ekwe ka ndị ọzọ nwụọ," ka o kwuru mgbe ya na Praịm Minista mba India Narendra Modi na-akparịta ụka site na vidio.
Cheta na wakporo Machchhar mgbe ọ na-anya ụgbọelu Flydubai FZ1073 si Dubai na-aga Tel Aviv n'isi ụtụtụ Wenezde.
Ụgbọelu ahụ gbadara ihe karịrị mita 5,200, tupu o zipụ akara mberede nke na-egosi na a na-awakpo ya maọbụ na a na-atọrọ ya.
Ndị njem mechara merie onye wakporo Machchhar, ebe ndị ọkwọ ụgbọelu abụọ nọ n'ụgbọelu ahụ rutere n'oche ndị na-anya ụgbọelu ma mee ka ụgbọelu ahụ daa n'enweghị nsogbu na Tabuk nọ na Saudi Arabia.
A kpọgara Machchhar n'ụlọọgwụ ma mesịa bufee ya Abu Dhabi, ebe a kọrọ na ọ nọ n'ọnọdụ ahụike kwụ chịm.
Praịm Minista Modi toro Machchhar, na-ekwu na mkpebi ngwa ngwa ya nyere aka ịzọpụta ndụ ọtụtụ mmadụ.
Machchhar kwuru na ya bụ onye ọkwọ ụgbọelu kemgbe afọ iri na asaa, nakwa na ya nwere ntụkwasị obi na ọ ga-agbake kpamkpam.
Nnyocha na-arụtụ aka na onye ọkwọụgbọelu sụkasịrị ogbo ya mma nwetara ọzụzụ ndị isi na-apụ anwụrụ nke Islam- Netanyahu

Ebe foto si, Getty Images
Praim Minista mba Israel bụ Benjamin Netanyahu ekwuola na nnyocha na-arụtụ aka na onye ọkwọụgbọelula ahụ sụkasịrị ogbo ya n'ime ụgbọelu Flydubai ahụ ụbọchị Wenezde bụ "nwetara ọzụzụ ndị isi na-apụ anwụrụ nke Islam".
Ụgbọelu Flydubai ahụ nke bu ndị njem ruru 170 jiri feet 17000 si n'elu datuo dara n'ime oge njem ha tupu ndị njem na ndị ọrụ ụgbọelu ahụ ejichie ọkwọụgbọelu sụkasịrị ogbo ya mma ma fetuo ụgbọelu ahụ.
Netanyahu gwara ụlọntaakụkọ Fox na "ndị njem na ndị ọrụ ụgbọelu ahụ jichiri nwoke ahụ ka ya agbụ dịka nwoke ahụ na-eti, " Gbuo m gbuo m', ya mere o doro anya na ọ chọrọ ịkwụ ụdọ."
A nwụchiela onye chọrọ ịkpọkasi ụgbọelu si Dubai na-aga Israel

Ebe foto si, AP
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
A nwụchiela otu ọkwọụgbọelu chọrọ ịsụgbu ọkwọụgbọelu ibe ya ma kpọkasịa ụgbọelu si Dubai na-efega mba Israel.
Praịm Minista mba Israel bụ Benjamin Netanyahu mere ka a mata nke a dịka ọ kọwara ihe mere n'ime ugboelu ahụ.
Ihe ahụ mere n'ụgbọelu 'FlyDubai' si Dubai na-aga Tel Aviv.
Ọ bụ oge ụgbọelu ahụ feniri elu nkeji ole ma ole ka ha were nsogbu ahụ mere e ji tinye ya isi na mba Saudi-Arabia bụ ebe ọ dara.
Otu onye nọ n'ụgbọelu ahụ kwuru na "oke mkpu na-ada tupu ụmụaka nwoke atọ tiba n'ebe ndị ọkwọụgbọelu na-anọ ma jichie onye mwakpo ahụ".
Onye ọzọ nọ n'ụgbọelu ahụ kwuru sị, "Anyị weghara ụgbọelu ahụ n'aka onye ahụ ji mma, dịka ndị ọkwọụgbọelu abụọ fọrọ n'azụ bịara weghara oche ma fetuo ụgbọelu ahụ".
Netanyahu kwuru si na ọkwọụgboelu ahụ aghọọla onye e ji eji dịka ndị ọrụ Saudi Arabia na-agba ya ajụjụ ọnụ.
Ọ gara n'ihu kelee ndị 'odogwu' nyere aka zọpụta ụgbọelu ahụ n'ọnụ ọnwụ; zọọ ọtụtụ ndị mmadụ ndụ ma gbochie nnukwu ọdachi."
Onye nnochiteanya mba Israel kwuru na ọkwọụgbọelu ahụ bụ onye Uinited Arab Emirate."





























