Amerịka akpọrọla ndịagha ha zitere na Naịjirịa

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Amerịka ewezugala ndịagha ha zitere na Naịjirịa na mmalite afọ a iji nye aka buo agha megide ọnọdụ enweghị nchekwa na-arị elu nakwa mwakpo otu ndị na-eyi ndụ egwu.

Ọnụ na-ekwuru ndịagha Naịjirịa bụ Michael Onoja gwara BBC na ọnọdụ a agaghị emetụta ikike ha ji ebu agha maọlị kama ha na ndịagha Amerịka ga-aga n'ihu na-ekekọrịta ozi ndị bara uru.

Nke a na-abịa dịka onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump kwupụtara na ogbunigwe ndịagha Amerịka si n'elu tụọ na Naịjirịa memilara ndị ndu otu ndị na-eyi ndụ egwu ma kwụsịkwa ogbugbu a na-egbu ndị na-eso ụzọ Kraịst na-ebe ọ dị ukwuu.

Naịjirịa na-agabiga nsogbu enweghị nchekwa aka nri aka ekpe, nke gụnyere mwakpo otu ndị ha na ndịagha jihad na-emekọrịta ihe, ndị ojiegbe nakwa ndị omekome.

Nke a mere ka Donald Trump boo ndị ọchịchị Naịjirịa ebubo na ha anaghị agba mbọ dịka ọ kwesịrị iji chekwaa ndụ ndị ha na-achị, ma kwuokwa na a na-egbu ndị na-eso ụzọ Kraịst aghara aghara na Naịjirịa.

Kemgbe ọnwa Disemba afọ gara, Naịjirịa na Amerịka kwuru na ndịagha ha ejikọtala aka buo agha n'ogige ndị na-eyi ndụ egwu iji mee ka nchekwa sikwuo ike.