You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ngagharịiwe Xenophobia: Gọvanọ Ụzodimma nyere ụmụafọ Imo e si Saụt Afrịka kpọlata otu nde naira, otu nde naira
Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzọdịmma enyela ndị bụ ụmụafọ Imo na ndị e si Saụt Afrịka Kpọlata otu nde naira , otu nde naira, dịka ụlọọrụ na-ahụ maka Ndị Naijiria nọ ofesi bụ 'Nigerians in Diaspora Commission'(NIDCOM) si kwuo n'ozi ha wepụtara.
Ụmụ Naịjirịa mmadụ 266 siri na mba Saụt Afrịka wụchie na Legọs n'ụtụtụ Fraịde dịka Gọọmenti Etiti kpọlatara ụmuafọ nọ Saụt Afrịka n'agba nke anọ ,dịka ngagharịiwe megide ndị mbịarambịara si Afrịka nọ na Saụt Afrịka na-aga n'ihu.
Nke a na-eweta ọnụọgụgụ ndị gọọmentị si Saụt Afrịka kpọlata ka ha ruo ihe karịrị mmadụ 700.
Ọnụ na-ekwuru Mịnịstrị na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na ndị mba ọzọ bụ Kimiebi Imomotimi Ebienfa, gwara BBC na mmadụ 266 wuchiri na Legọs n'ebe elekere 10:30 nke ụtụtụ, abalị atọ nke ọnwa Julai, afọ 2026.
Naịjirịa malitere ibubata ụmụafọ ha bi mba ahụ dịka ngagharịiwe megide ndị mbịarambịara ejighị akwụkwọ, nke mere ka ụfọdụ ụmụ Naịjirịa rịọwa enyemaka gọọmentị iji si ebe ahụ lọta n'ihi egwu maka ndụ ha.
Nke abụ ndị nke anọ a na-ebulata dịka ndị ọrụ gọọmentị na-ekwu na ọ ka nwere ndị a ga-ebulata ndị ọzọ na abalị isii nakwa abalị Itoolu nke ọnwa Julaị, afọ 2026.
Gọọmentị agwala ụmụamala na-alọta ka ha dekọ ihe ndị ha nere ebe ahụ sị na e mecha gọọmentị Naijria ga-achọ ka Gọọmentị Saụt Afrika kwụọ ha ihe iti aka n'obi.