Alaọmajiji Venezuela: Ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'alaọmajiji eruola 2600

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Onyeisi ọchịchị nchere oge Venezuela bụ Delcy Rodríguez, ekwuola na ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ n'oke alaọmajiji abụọ kụrụ obodo ahụ n'izu gara aga eruola 2600.

Rodríguez kwuru na ndịọrụ gbatagbata ka na-achọ ndị ọzọ nwere ike ịdị ndụ n'okpuru aja na ewumewu dara ada.

Na Tọzdee, ndị ọrụ gbatagbata zọpụtara otu nwoke dị ndụ aha ya bụ Hernand Hill, Ka ọ nọrọ ụbọchị itoolu n'okpuru ụlọ dakwasịrị ya.

A kọwara nwoke ahụ dị ka Hernand Hill, onye na-arụ ọrụ nchekwa, bụkwa di na nna ụmụ abụọ.

Ndịọrụ gbatagbata kwuru na Hill anwụghị n'ihi na ihe dara n'ahụ ya, mana ụzọ ọ ga-esi pụta mechiri emechi. Ha kwuru na ndịọrụ mgbanyụọkụ si Venezuela na mba ndị ọzọ rụkọrọ ọrụ ọnụ iji ruo ebe ọ nọ ma wepụta ya n'enweghị nsogbu.

Rodríguez kwukwara na gọọmenti agaghị eli ndị nwụrụ n'ili ọha, n'agbanyeghị nkatọ ụfọdụ ndị na-ekwu na ndị ọchịchị akwadebeghị nke ọma tupu mgbe alaọmajiji ahụ mere.

Ka ọ dị ugbu a, ọrụ nnapụta na-aga n'ihu, ebe ezinụlọ ndị ọtụtụ mmadụ ka na-atụ anya na a ga-achọta ndị ha hụrụ n'anya dị ndụ.

Dịka ọnụọgụgụ ndị nwụrụ rịala ruo 1700, WHO etiela mkpu maka ntịwapụ ọrịa

Otu ahụike mbaụwa bụ 'World Health Organisation' (WHO) ekwuola na usoro ahụike Venezuela nọ n'oke nsogbu kemgbe oke alaọmajiji abụọ kụrụ obodo ahụ n'izu gara aga.

Dịka WHO si kwuo, ihe karịrị mmadụ 1,700 anwụọla, ebe ihe karịrị mmadụ 5,000 merụrụ ahụ.

Alaọmajiji ahụ mebikwara maọbụ kwatuo ọtụtụ ụlọ kariri otu nari.

Ọnụ na-ekwuru WHO bu Christian Lindmeier gwara ndi ntaakụkọ na Geneva na ihe karịrị ụlọọgwụ atọ emebiela, ebe isii ndị ọzọ na-arụ ọrụ n'ụzọ pere mpe.

Ọ gbakwụnyere na ụlọọgwụ ndị ka na-arụ ọrụ juputara n'ọnụ ọgụgụ ndị ọrịa, nke mere ka ọrụ ịwa ahụ na nlekọta ndị ọrịa sie ike.

WHO kwukwara na a ka na-achọ ụfọdụ ndị ọrụ ahụike, ọkachasị ndị na-ahụ maka ime na ọmụmụ nwa, na mpaghara La Guaira, ihe ha kwuru na ọ na-akpata nnukwu nsogbu n'ịnye ndị inyom dị ime nlekọta ahụike.

Ọnụọgụgụ ndị nwụrụ arịala ruo 1450

O pekata mpe mmadụ1,450 anwụọla na ala ọmajiji abụọ mere na Venezuela n'ụbọchị Wenezde, ebe a na-atụ anya na ọnụọgụgụ ndị o gburu ga-arịkarịa.

Olileanya na e nwere ike ịzọpụta ndị tọrọ n'okpuru ewumewu akpụwala n'ala dịka e nweghị igwe zuru iji ebuli ewumewu ada iji zọpụta ndị ka tọrọ n'ime ala.

Otu onye ji ndụ ya pụta n'ala ọmajiji ahụ tụrụ arirị maka enweghị nkwado n'aka Gọọmentị mba ahụ iji zọpụta ndị ka tọrọ n'ime ala.

Nwoke ahụ nke akpọghị aha ya na-achọ ndị ezinaụlọ ya na-efu efu gwara ụlọ ntaakụkọ Reuters sị, "Anyị chọrọ nkwado, anyị chọrọ nnukwu igwe."

"Anyị chọrọ ka anyị na ndị ezinaụlọ anyị soro anyị. Ọ bụghị naanị m nọ n'ụdị ọnọdụ a. Ha nwere ike ha agaghị enye anyị ohere ị nọ ebe a ọzọ. Ha enyereghị anyị aka ịkpochasị ihe dara ."

Nwoke ahụ kwuru na e nwere mmadụ 300 nọ n'ụlọ ahụ mana ọ bụ naanị mmadụ 80 ka hụrụ na ndụ maọbụ n'ozu.

Nwaanyị mụrụ nwa a zọpụtara ya na nwa sị na ọ bụ nwa ya dowere ya ndụ

Nwaanyị a zọpụtara n'okpuru ụlọ ha na Venezuela ya na nwa ọhụrụ ya n'ihe ọ bụ naanị ọrụ ebube nwere ịkọwa ka o siri gaa , gwara BBC na ọ bụ nwa ya dị ọnwa 18 dowere ya ndụ.

Dayana Patino sị na nwa ya nwoke bụ Juan David nyere ya "mkpalite ịmụrụ anya na-eche oge".

Ọ sịrị, "Ọ bụrụ na ọ dị ndụ, m ga-adị. Anọ m na-emetụ ya aka n'imi kwa mgbe kwa mbe iji mata ma ọ ka na-eku ume."

N'ihe onyonyo ebe a zọpụtara nwaanyị ahụ fegharịrị n'ụwa dịka nzọpụta nwa ya bụ Juan David ghọrọ ihe olileanya nye Venezuela bụ ebe alaọmajiji abụọ mere na mba ahụ butere ọnwụ o pekata mpe mmadụ 1450.

Ọnụọgụgụ ndị nwụrụ arịala ruo 589

Ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'alaọmajiji abụọ mere na mba Venezuela arịala rue mmadụ 589, ebe mmadụ 2,980 merụrụ ahụ dịka onye na-arụ ọrụ dịka Onyeisiala bụ Delcy Rodríguez si kwuo.

Ka nke a na-eme, ndị gbatagbata sị mba ndị ọzọ gụnyere ndị si mba Swizaland na Meziko esonyela n'inyere ndị mmadụ ihe metụtrara aka.

Ọnụọgụgụ ndị nwụrụ arịala ruo 235

Ndị ọrụ gbatagbata ka na-achọ ụlọ dagara ada iji zọpụta ndị tọrọ dịka ọmajiji biri ọtụtụ ihe na mba Venezuela, gbuo o pekatampe mmadụ 235, ma merụọ mmadụ ruru 43000 ahụ.

Na Caracas bụ isobodo mba ahụ nakwa obodo La Guaira, ndị mmadụ na-anụ olu ndị tọrọ n'okpuru ala ka ha na-eti mkpu ka a bịa zọ[ppụta ha.

A na-eche na ndị nwụọrọla karịrị ọle agụrụola n'ọnụọgụgụ, ebe ọtụtụ enweghịzịkwa ụlọ, ebe ụfọdụ na-atụ egwụ ịnọ n'ụlọ ha.

Etu alaọmajiji si taa isi mmadụ 32, merụọ mmadụ 700 ahụ na Venezuela

Ihe karịrị mmadụ 32 anwụọla, ebe ọpekatampe mmadụ 700 merụrụ ahụ, mgbe oke alaọmajijiji abụọ kụrụ Venezuela n'akụkụ isi obodo ya, Caracas.

Dịka ndị ọrụ ụlọọrụ nnyocha alaọmajijiji nke Amerịka bụ 'US Geological Survey (USGS)' si kwuo, alaọmajijiji mbụ a mere, rụrụ ogogo 7.2, ebe nke abụọ na-erughị otu nkeji rụrụ ogogo 7.5.

Onye nọ dịka onyeisi ọchịchị mba Venezuela bụ Delcy Rodríguez, ekwupụtala ọnọdụ mberede na mba ahụ, ma ziga ndị ọrụ gbatagbata ka ha na-achọ ndị ka nọ n'okpuru ụlọ ndi dara ada.

Akụkọ kwuru na ọtụtụ ụlọ dara ada, ebe ụfọdụ mebiri nke ukwuu na Caracas na mpaghara ndị ọzọ. Ọdụụgbọelu mba ụwa nke Maiquetía mechiri emechi n'ihi mmebi ọ nwetara.

Ndịọrụ nnyocha kwuru na enwereike ịhụ ozu ndi mmadu na mmebi ndị ọzọ ka ọrụ nzọpụta na-aga n'ihu.

Alaọmajijiji ahụ metụtakwara ụfọdụ mpaghara mba Kolombịa, ebe ọtụtụ ndị bi na ya kwuru na ha nụrụ mkpọtụ na ịmajijiji ahụ.

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump, kwuru na Amerịka dị njikere inyere Venezuela aka n'ọrụ nzọpụta na mgbake.