Ndị uweojii ejidela Ogechi Ofoma maka ebubo iji mma ọkụ merụọ nwa ya nwaanyị ahụ

Njirimara ndị uweojii Anambra steeti na nwatakịrị ahụ nne ya ji mma ọkụ merụọ ahụ

Ebe foto si, Anambra State Police Command

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụlọọrụ ndị uweojii n'Anambara steeti ekwuola na ha ejidela otu nwaanyị aha ya bụ Ogechi Ofoma, dị afọ iri atọ na abụọ maka ebubo ịkpagbu nwatakịrị dị afọ asaa aha ya bụ Oluebube Ofoma n'Obosi dị n'okpuru ọchịchị Idemili Nọt dị na steeti ahụ.

Ọ bụ ụlọọrụ ndị uweojii nakwa mịnịstrị na-ahụ maka ụmụnwaanyị jikọrọ aka ọnụ zọpụta nwatakịrị ahụ, duga ya ụlọọgwụ ma nye ya nchekwa dịka nwata.

N'ozi kọmishọna ndị uweojii n'Anambara steeti bụ Nnanna Oji Ama binyere aka ka ọ katọrọ ihe mere ma kwee nkwa na nwatakịrị ahụ ga-enwete ikpe ziri ezi.

Ndị uweojii kwuru na ha nwetere ozi banyere ihe na-eme n'abalị iri na atọ nke ọnwa Septemba 2026 banyere udịrị ahụ nwaanyị ahụ merụrụ nwatakịrị ahụ aha ya bụ Oluebube Ofoma dị afọ asaa.

Ọ sị na ọ bụ nke a mere ndị uweojii si n'obodo a na-akpọ Ibollo, dị n'Awada-Obosi, nakwa ndị agbataobi ji nyereaka wee jide nne ya bụ Ogechi Ofoma, dị afọ iri atọ na abụọ.

Dịka ndị uweojii si kwuo, "nnyocha na-egosi na a na-akpagbu nwatakịrị a ma jiri mma ọkụ merụọ ya nnukwu ahụ".