Onye bụ Ugo Ugochukwu tuuru ugo n'egwuregwu Formula 3 na mba Amerịka?

Ebe foto si, Ugougochukwu/Instagram
Ugo Ugochukwu Orlandi bụ nwaokoroọbịa dị afọ 19 ma bụrụkwa onye ọkwọụgbọala a maara nke ọma na gburugburu ụwa dịka onye na-esonye n'asọmpi iji ụgbọala agba ọsọ bụ nke a na-akpọ 'car racing' maọbụ 'motorsport' n'asụsụ bekee.
N'ụbọchị Sọnde, abalị 13 nke ọnwa Septemba 2026 ka Ugochukwu banyere n'akụkọ ihe mere eme dịka onye tuuru ugo n'asọmpi '2026 FIA Formula 3 Drivers' Championship' na mba Amerịka.
Ugo ji akara iri na anọ merie Freddie Slater bụ nwaafọ Briten mara ya aka iji turu ugo n'ịmaaka FIA Formula 3 championship na Spanish Grand Prix, nke mere ya onye Amerịka mbụ ga-erite nturu ugo ahụ.
Mana e wezuga nke a, Ugo kwuru na o nwere njirimara ya ọzọ o ji akpa nganga. Nke bụ maka na o nwere mgbọrọgwụ na Naịjirịa.
Ugochukwu nwere mgbọrọgwụ na Naịjirịa ma bụrụkwa nwaafọ mba Amerịka dịka nne na nna ya mụrụ ya n'obodo New York n'abalị 23 nke ọnwa Eprel n'afọ 2007.
Nne ya bụ Oluchi Onweagba, nwaada Naịjirịa a ma ama n'ihe gbasara ejije na ịchọ mma nke a na-akpọ 'fashion model' n'asụsụ bekee, ebe nna ya bụ Luca Orlandi, onye mba Itali.
Oluchi, nne Ugochukwu, bụ onye Isuikwuato dị n'Abia steeti, ebe ọ tolitere na mpaghara obodo Lagos Mainland.
Ugochukwu malitere igosi nka pụrụ iche n'ịkwọ ụgbọala mgbe ọ dị naani afọ isii, ka o sonyere n'asọmpi Karting.
N'afọ 2021, mgbe ọ dị afọ 13, nnukwu otu ụgbọọsọ bụ 'McLaren Driver Development Programme' tinyere ya n'usoro ọzụzụ ndị ọkwọụgbọala ya.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Etu Ugochukwu si chawapụ site na ịkwụụgbọ Karting banye na Formula 3
Ugochukwu jiri ịkwọụgbọ Karting rute n'ọtutụ ọkwa dị elu. Ọ meriri asọmpi 'European OK-Junior karting' nke nyere aka mee ka aha ya pụta n'anya ndị otu Formula 1.
N'afọ 2023, o meriri asọmpi Euro 4 Championship.
N'afọ 2024, o meriri Macau Grand Prix, ma bụrụkwa onye Amerịka mbụ meriri asọmpi ahụ kemgbe 1981.
Ọ banyere n'asọmpi FIA Formula 3 n'afọ 2025; ọ bụ ezie na inweta mmeri n'ọtụtụ asọmpi siri ya ike na mbịdo mana afọ 2026 gbanwere akụkọ ya.
Ugochukwu laghachiri n'afọ 2026 ma pụta dịka otu n'ime ndị kacha baa uru n'asọmpi ahụ.
O meriri n'ọtụtụ asọmpi dịka 'Formula Regional Oceania Trophy', na 'Feature Race' e mere na Melbourne, nakwa ndị ọzọ. Mmeri ndi a nyere ya nnukwu nkwado o ji nweta iko mmeri nke 'FIA Formula 3 Championship'.
Kedụ ihe mmeri Ugo Ugochukwu pụtara?
Mmeri a emeela ka Ugochukwu bụrụ onye mba Amerịka nke mbụ tuuru ugo n'asọmpi 'FIA Formula 3 Drivers' Championship'.
O tinyere aha ya dịka otu n'ime ndị ọkwọụgbọala na-eto eto ugbua a na-ele anya na ha nwere ike iru Formula 2 na Formula 1.
Mmeri Ugochukwu emewo ka aha Naịjirịa chakee na gburugburu ụwa, ma tinyekwa aha ya dịka onye na-eso nzọ ụkwụ ụmụ Naịjirịa a ma ama n'asọmpi ịkwụụgbọala nke gụnyere Bisi Ezerioha, Kola Aluko, nakwa Josiah Reaume.
Dịka o lekwasịrị anya ugbua n'ogogo nke ọzọ n'egwuruegwu ụgbọala, ọkwọụgbọala a na-eto eto bụ onye e kwesịrị ikiri ekiri.






























