Ikpo unyi adaala ma gbuo mmadụ iri atọ na otu na mba Guinea

Aha onyonyo, Ikpo unyi adaala ma gbuo mmadụ iri atọ na otu na mba Guinea
Ikpo unyi adaala ma gbuo mmadụ iri atọ na otu na mba Guinea
    • Onye dere ya, Michael Ilediagu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Ebeg o si, Lagos
  • Mgbe e biputara ya

Mmadụ ruru iri atọ na otu wụrụ n'oge mgbidi unyi e kpofuru ekpofu dakwasịrị ọtụtụ ụlọ obibi ndị mmadụ ma mebie ọtụtụ ihe.

Nke a mere na mpaghara Darres-Salam dị na Conakry bụ isi obodo mba Guinea.

Gọọmenti mba ahụ ezigala ndị ọrụ gbagbata n'ebe ihe ahụ mere dịka ndị mmadụ na-atụ ụjọ na ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ anwụ nwereike ịrị elu.

Praịm mịnịsta mba Guinea bụ Mamadou Oury Bah agaala n'ebe ihe a mere ma hụta etu ndị gbagbata si azọpụta ndị ihe mberede ahụ dakwasịrị.

Ndị hụrụ mgbe ihe a mere kwuru na ọtụtụ mmadụ nwereike ịnọ n'ime ala dịka ikpo unyi ahụ dakwasịrị ha.

Dịka onye mbụ gwara ndị ntaakụkọ ihe ọ hụrụ si kwuo "ihe a mere n'ihe dịka elekere abụọ nke isi ụtụtụ. Anyị nụrụ mkpọtụ ugboro abụọ. Mana ọ bụ nke abụọ. Ikpo unyi dakwasịrị ụlọ. E gwupụtala ozu mmadụ ruru iri abụọ na abụọ maọbụ karịa. Ihe anyị hụrụ na-agba anya mmiri."

Onye nke abụọ kọwa ka ya na nwunye ya si gbaa ọsọ ndụ ha. N'okwu ya "ka anyị nụrụ nnukwu mkpọtụ. A kpọrọ m nwunye m gwa ya ka anyị si n'ime ụlọ pụọ. Anyị nụrụ ka igwe mmadụ na-ebe akwa. Nke a mere ọtụtụ ndị mmadụ ji gaa ihụta ihe na-eme n'ebe ahụ. N'ihe na-erughị nkeji atọ, ikpo unyi ahụ dakwasịrị ndị ahụ niile gara ịma ihe na-eme."

Cheta na mba Guinea enwela ụdịrị ọdachịa a n'otu ebe ahụ n'afọ 2017 nke gburu mmadụ iri.

Ugbua gọọmenti mba ahụ enyela iwu ka ndị niile bi nso na gburugburu ebe ihe a mere kwapụ mana ọtụtụ ndị ahụ ekweghị pụọ.