Ikpo unyi adaala ma gbuo mmadụ iri atọ na otu na mba Guinea
- Onye dere ya, Michael Ilediagu
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Ebeg o si, Lagos
- Mgbe e biputara ya
Mmadụ ruru iri atọ na otu wụrụ n'oge mgbidi unyi e kpofuru ekpofu dakwasịrị ọtụtụ ụlọ obibi ndị mmadụ ma mebie ọtụtụ ihe.
Nke a mere na mpaghara Darres-Salam dị na Conakry bụ isi obodo mba Guinea.
Gọọmenti mba ahụ ezigala ndị ọrụ gbagbata n'ebe ihe ahụ mere dịka ndị mmadụ na-atụ ụjọ na ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ anwụ nwereike ịrị elu.
Praịm mịnịsta mba Guinea bụ Mamadou Oury Bah agaala n'ebe ihe a mere ma hụta etu ndị gbagbata si azọpụta ndị ihe mberede ahụ dakwasịrị.
Ndị hụrụ mgbe ihe a mere kwuru na ọtụtụ mmadụ nwereike ịnọ n'ime ala dịka ikpo unyi ahụ dakwasịrị ha.
Dịka onye mbụ gwara ndị ntaakụkọ ihe ọ hụrụ si kwuo "ihe a mere n'ihe dịka elekere abụọ nke isi ụtụtụ. Anyị nụrụ mkpọtụ ugboro abụọ. Mana ọ bụ nke abụọ. Ikpo unyi dakwasịrị ụlọ. E gwupụtala ozu mmadụ ruru iri abụọ na abụọ maọbụ karịa. Ihe anyị hụrụ na-agba anya mmiri."
Onye nke abụọ kọwa ka ya na nwunye ya si gbaa ọsọ ndụ ha. N'okwu ya "ka anyị nụrụ nnukwu mkpọtụ. A kpọrọ m nwunye m gwa ya ka anyị si n'ime ụlọ pụọ. Anyị nụrụ ka igwe mmadụ na-ebe akwa. Nke a mere ọtụtụ ndị mmadụ ji gaa ihụta ihe na-eme n'ebe ahụ. N'ihe na-erughị nkeji atọ, ikpo unyi ahụ dakwasịrị ndị ahụ niile gara ịma ihe na-eme."
Cheta na mba Guinea enwela ụdịrị ọdachịa a n'otu ebe ahụ n'afọ 2017 nke gburu mmadụ iri.
Ugbua gọọmenti mba ahụ enyela iwu ka ndị niile bi nso na gburugburu ebe ihe a mere kwapụ mana ọtụtụ ndị ahụ ekweghị pụọ.



