Ụmụnwaanyị Affa dị n'Enugwu Steeti mere ngagharịiwe maka ntọrị ndị mmadụ n'ụlọụka Katọlik

Ụmụada obodo Affa na-eme ngagharịịwe maka ntọrị ndị mmadụ n'ụlọụka dị n'obodo ha.

Ebe foto si, Screen shot

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụmụnwaanyị obodo Affa dị n'okpuruọchịchị Udi nke Enugwu Steeti emeela ngagharịiwe maka mwakpo ndị ojiegbe wakporo ụlọụka St. Joseph Katọli dị n'obodo ha ma tọọrọ mmadụ abụọ na Sọnde abalị abụọ nke ọnwa Ọgọst afọ 2026.

Ụmụnwaanyị kpagharịrị n'okporoụzọ obodo ha na-agbanyeghi mmiri na-ezo na-ama ha ma rịọ ka gọọmenti gbatara ha ọsọ enyemaka maka ọnọdụ ọjọọ nke nchekwa.

Ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia gosiri ka ụmụnwaanyị bucha ahịhịa na-abịa n'etiti okporoụzọ dịka ha na-abụ abụ na ukwe.

Ha kọwara na ụlọụka bụ ebe a na-ahụta dịka ebe izere ndụ site na nsogbu ọbụla abụrụ ebe ndị ekperima na-eme mwakpo na-atụghị egwu ọbụla.

In the video seen by SaharaReporters on Monday, the leading spokesperson was seen wailing openly in the rain.

Ha kpọkuru gọvanọ Peter Mbah na-achị steeti ahụ, onyeisioche okpuruọchịchị Udi bụ Hyginus Agu na Sịnetọ Osita Ngwu na-anọchiteanya ka ha biko gbapụ ọsọ n'iwete ezi nchekwa n'obodo ha.

Ụmụada obodo Affa ji akwụkwọ ahịhịa ndụ na-eme ngagharịiwe na gburu gburu obodo ha.

Ebe foto si, Screen shot

Etu ndị ntọrị ahụ siri wakpoo ụlọụka Katọlik ahụ

Ndị obodo Inoyi Affa, onyeisioche okpuruọchịchị udi nakwa ọkọlọtọ ndị uweojii n'Enugwu Steeti

Ebe foto si, Enugu State Police

Akụkọ pụtara n'ụtụtụ Sọnde ụbọchị abụọ nke ọnwa Ọgọst kwuru na ndị ojiegbe wakporo ụlọụka St. Joseph Katọlik dị n'obodo Inoyi Affa nke okpuruọchịchị Udi n'Enugwu Steeti.

N'ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia gosiri ka ọtụtụ ndị obodo ahụ na-eti mkpu ma kọwaa na ndị ojiegbe tọọrọ otu onye Seminarịa, otu katikist na otu onye ọzọ mgbe ha na-akwado imalite ofufe n'ụlọụka ahụ.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ha kwuru na ndị ojiegbe a ruru mmadụ iri bucha egbe AK47 ma na-agbali ya elu dịka ha kpọọrọ mmadụ atọ ahụ si n'ụlọụka na-apụ nke mere na ndị mmadụ enweghi ike chụnwuo ha ọsọ.

Otu nwoke na-ekwu okwu n'ihe onyonyo ahụ na-akpọghị aha ya sị na e mechara tọhapụ katikist ahụ ma jidezie onye seminarịa na otu onye ọzọ.

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị obodo pụtara n'igwe ma kpagharịrị n'ime ọhịa ịchọpụta ebe ndị a zoro mana o nweghizi ndị ha hụrụ.

Onyeisioche okpuruọchịchị Udi bụ Ogbonnaya Agu mechara duru ndị ọrụ nchekwa wuchie n'obodo ahụ mana ha ahụghị ndị ntọrị ahụ.

Kọmishọna Uweojii Enugwu Steeti bụ Mamman Bitrus Giwa kwuru na ha ehiwela otu ndị ọrụ nchekwa 'Joint Task Force' n'obodo Inoyi Affa ebe ihe a mere.

Giwa kwuru na ọ bụ ndị ọrụ nchekwa chụrụ ndị ntọrị a ọsọ nke mere ha jiri hapụ otu onye n'ime ndị ha tọọrọ.

Giwa kwere nkwa na aka ndị ọrụ nchekwa ga-akpara ndị ahụ n'oge na-adịghị anya.

Ọ gwara ndị mmadụ ka ha weta ozi ịgba ama ọbụla ga-enye aka ijide ndị omekome ahụ ma zọpụta ndị ahụ ha tọọrọ ozigbo ozigbo.