Nwaanyị e boro ebubo iji mma sụgbuo di ya mgbe ọ na-ehi ụra n'Aba, Abia Steeti

Ebe foto si, Ejijah Udo
Akụkọ si n'obodo Umuokereke Ngwa nke okpuruọchịchị Obingwa dị n'Abia Steeti na-ekwu na otu nwaanyị a kpọrọ Serah Innocent ewerela mma sụgbuo di ya bụ Innocent Nwaoji n'abalị Satọde 8 Ọgọst 2026.
Ndị agbataobi nọ mgbe ihe a mere kwuru na nwoke ahụ nọ na-ehi ụra mgbe nwunye ya wakporo ya jiri mma sụọ ya n'akụkọ obi.
Nke a tụrụ ndị obodo n'anya ka ụdịrị ọdachi a jiri mee.
Ihe onyonyo e ziteere BBC Igbo gosiri ebe ndị mmadụ gbakọtara na-achọ iburu nwamadị a gawa n'ụlọọgwụ ebe nwunye ya nọ n'akụkụ ya n'ebe akwa.
Otu onye ndu obodo ahụ bụ David Amaraizu gwara BBC Igbo n'ekwentị na ọdachi a mere n'ezie na o tinye nnukwu ụjọ n'ahụ ndị obodo.
O kwuru na otebeghi aka di na nwunye a ka lụrụ onwe ha, na ha gbara akwụkwọ n'ọnwa Disemba afọ 2025, n'ime ihe dịka ọnwa asatọ gara aga.
Ọ sị na ọ maghị ma nwaanyị a na di ya ọ na-enye esemokwu ezinaụlọ nke nwereike ime ka ọ kpaa ụdịrị agwa a.
Amaraizu gara n'ihu kwuo na a nwụchiela ya, nọ ọ nọ n'aka ndị uweojii ugbua, ebe e tinyela ozu di ya n'ụlọ ebe a na-echekwa ozu.
Mana tupu akụkọ a apụta o nwebeghi ihe ndị uweojii Abia Steeti kwurula banyere ọdachi a.
Onye ntaakụkọ BBC zigaara ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii bụ Maureen Chinaka ozi mana ọ zabeghi ya ruo mgbe akụkọ a pụtara.
Ya mere akụkọ etu ihe a siri mee, ihere nwaanyị a jiri mee ya edochabeghi anya.
Akụkọ ka na-abịa...





























