Ebumnuche ụfọdụ ndị na-azọ ọkwa onyeisiala Nigeria bụ naanị iweghara ọchịchị - Donald Duke
Onye ji ọkọlọtọ People's Redemption Party (PRP) azọ ọkwa onyeisiala Nigeria na ntuliaka na-abịa n'afọ 2027 bụ Donald Duke ekwuola na ebumnuche ọtụtụ ndị na-azọ ọkwa onyeisiala na Nigeria ugbua bụ naanị iweghara ọchịchị bụ nke gosipụtara n'ihe ha na-ekwu n'ọnụ.
Na mkparịtaụka pụrụ iche nke ya na BBC nwere, ka o kwuru na nke bụ eziokwu bụ na onye ọbụla chọrọ inweta ọchịchị na ihe ndị yiri ya, mana ọ dị mkpa ka onye ọbụla itinye ọchịchọ nke onwe anyị n'okpuru ọdịmma ọha na eze.
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ ga-aka ma ndị niile na-agba gọọmenti ụkwụ gbakọrọ aka ọnụ wepụta otu onye ga-azọ ọkwa onyeisiala.
Dịka o siri kwuo; "Echere m na ọ ga-aka mma ma anyị jikọọ aka ọnụ. Ọ bụrụ na ebumnuche anyị n'ịbanye n'ọkwa ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ maka ọdịmma obodo, ka anyị buru ụzọ kwekọrịta n'ihe anyị chọrọ imezu tupu anyị ekpebie onye ga-arụ ya nke ọma."
Duke kwukwara na ọtụtụ ihe agbanweela n'akparamaagwa ndị na-atụ vootu ugbua karịa ka ọ dị n'oge mbụ.
"Were dịka ọmụmaatụ, onye bụbu Osote onyeisiala Atiku Abubarka na Peter Obi; ọdịiche dị n'etiti ha bụ naanị ihe dịka vootu puku narị itoolu (900,000). Ọ ga-abụ ihe "nzuzu" iche na ndị tụnyere ha vootu n'afọ 2023 ka nọ ebe ahụ, na-eche naanị ha. E nweela nnukwu mgbanwe n'etiti ndị na-atụ vootu, dịka ha na-agbanwe nhọrọ ndị ha chọrọ ugboro ugboro," ka o kwuru.
N'ihe banyere ọchịchị Onyeisiala Bola Tinubu, Duke kwuru na o nweghị ihe dịka ego enyemaka mmanụ ụgbọala bụ 'subsidy'.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
"Mmanụ agbịdị bụ nke gị ọ bụ n'ala ka e si egwupụta ya. Nke a pụtara na ọ bụanyị niile nwe ya. Atụle na ọnụahịa mmanụ ụgbọala dị na Nigeria na nke mba na-anaghị emepụta ihe ọ bụla. Ka anyị sị Namibia ma ọ bụ ihe yiri ya. Ọ gaghị abụ otu ihe ahụ n'ihi na ị nwere uru sitere n'okike," ka ọ gbakwunyere.
O kọwara na ya ahụtaghị ihe ọbụla gosịrị na gọọmenti ugbua na-akwalite ikike ọrụ na imepụta ihe na Nigeria.
"Ọ bụrụ na ị ghọtara ebumnuche gọọmentị, nke bụ ịkwalite ikike ụmụafọ ya nwere ịrụ ọrụ na imepụta ihe, jụọ onwe gị: kedụ atụmatụ ndị kwalitere ikike ha n'akụkụ a?" ka o kwuru.
Dịka o siri kwuo; "Mgbe ị malitere n'ọrụ, n'ezie, n'ime ihe dịka otu afọ, ị zụtara ụgbọelu ọhụrụ na ihe ndị ọzọ dị otu ahụ. Ihe ndị ahụ anaghị eziga ozi ziri ezi. Ihe ịrịba ama ndị ahụ dị ebe ahụ. Banyere akụkụ ọchịchị ndị ọzọ, mgbe ị malitere inwe ụlọọrụ adịgboroja. Anyị chọpụtara abụọ. Ole ka dịkwa nke anyị na-amaghị maka ha?"
Nke ahụ pụtara na ọ dịghị ihe bara uru dị na ya ma a bịa n'ihe gbasara ọchịchị.



