Etu e si gbuo Umukoro Efemena na ndị ọzọ n'emume ịchụnta vootu ndị NDC na Delta State

Sịnetọ Ovie Omo-Agege na Umukoro Efemena
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ndị ojiegbe gbagburu mmadụ isii bụ ndị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Nigeria Democratic Congress (NDC) n'oge Sịnetọ Ovie Omo-Agege na-eme ngaghalị ịchụ nta vootu n'abalị garaaga bụ Nọvemba 24 2026.

Nke a mere n'obodo a na-akpọ Uduere, n'okpuru ọchịchị Ugheli North dị na Delta state.

Mmadụ anọ nwụrụ na mkpamkpa ahụ ebe ọtụtụ ndị ọzọ a gbara egbe nọ n'ụlọọgwụ ugbua.

N'ime mmadụ anọ nwụrụ gụnyere Moses Anaughe na Akima Efemena Umukoro bụ ndị na-arụrụ Sịnetọ Ovie Omo-Agege ọrụ.

Sịnetọ Ovie Omo-Agege bụ sịnetọ na-anọchịtaanya mpaghara Delta Central Senatorial ma jiri ọkọrọtọ Nigeria Democratic Congress (NDC) na-azọ ọkwa ahụ n'afọ 2027.