Gịnị na-ese dịka Peter Obi na Kwankwaso na-abia ọgbakọ NDC n'Enugu taa?

Gọvanọ Peter Mbah, Peter Obi nakwa Rabiu Kwankwaso
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Esemokwu butere ntụmsara adapụtala n'Enugu steeti dịka onye na-azọ ọkwa Onyeisiala na otu NDC bụ Peter Obi na osote ya bụ Rabiu Kwankwaso na-akwado ịzọchi na steeti ahụ maka ọgbakọ obodo nke pati ha.

N'ụbọchị Wednezde, ụfọdụ ndị otu NDC n'Enugu state tiri mkpu, na-ebo ebubo na Gọvanọ steeti ahụ bụ Peter Mbah nyere iwu ka ndị pati ahụ ghara inweta ohere iji Amadeo Event Centre, mee ọgbakọ obodo 'Townhall' nke pati ahụ kwodor ime.

NDC n' Enugu steei hiwere ọgbakọ obodo ụbọchị Tozde, abalị 29 nke ọnwa ọktọba afọ 2027 bụ ebe ha na-atụ anya na onye na-azọ ọkwa onyeisiala na ha pati ahụ bụ Peter Obi na osote ya bụ Rabiu Kwankwaso ga-abịa.

N'ihe onyonyo fegharịrị ụbọchị Wenezde, onye na-azọ ọkwa Senatọ ịnọchite Enugu East na ntuliaka 2027 n'aha otu NDC bụ Ada Ogbu boro ebubo na Gọvanọ steeti ahụ bụ Peter Mbah nyere iwu ka a ghara ikwe ka ha nweta ebe pati ahụ ga-ebe ọgbakọ bụ nke ha kwụrụ ụgwọ ya.

N'ihe onyonyo gosiri ọnọdụ ebe ihe e ji edozi ụlọ nakwa akọrọngwa ndị ọzọ dị na mbara otu ụlo mmemme na ụfọdị ndị e chere bụ ndị NDC, ọ sịrị,"Ha ekweghị ka ndị na-edozi ọnọdụ (decorators) , ndị na-agwakọ egwu (DJ) butuo akọrọngwa , sị ha na gọvanọ sịrị na ọnọdụ a bụ maka naanị ihe metụtara ụmụakwụkwọ, na ọbụghị maka ihe ndọrọndọrọ ọchịchị."

"Ha na-achọ ịkwụsị ọgbakọ 'Townhall Peter Obi n'ihi ndọrọndọrọ ọchịchị."

"Anyị kwụrụ nde naira iri atọ na ọkara (₦3.5 m) maka imeụlọ ma kwụọ ọkara nde naira maka ezi mana ugbua ha na-achọ ịkwụsị anyị.Ọ gaghị eme."

N'otu aka ahụ, Ọnụ na-ekwuru Christian Chinyeaka,onye na-azọ ọkwa gọvanọ steeti ahụ bụ Sampson Ukwu kwuru na ozi mgbasaozi o binyere aka ma wepụta ụn=bọchị Wenezde na ha inweta ọnọdụ ahụ maka ọgbakọ ahụ mana gbanwe obi ya n'ikpeazụ.

Ukwu kwuru sị, "Anyị nwetara ọnọdụ ahụ maka Thursday, abalị 29 nke ọnwa Oktoba afọ 2026 n'Elekere isii."

"O ruo n'ikpeazụ a napụ anyị ya, dịka a gbaliri ikposa ihe ndọrọndọọ ọchịchị nke pati anọghị n'ọchịchị n'Enugu chọrọ ime."

Mana gọvanọ Enugu steeti bụ Peter Mbah agọọla n'ebubo na ọchịchị ya achọghị inye ohere ka NDC nwee ọgbakọ ha, sị n'ebubo ahụ bụ "Okpotokpo ụgha".

N'ozi o wepụtara n''akara ọba ozi ya na X ụbọchị Wenezde, Peter Mba kwuru sị

" Anya m eruola ihe onyonyo na-efegharị ebe a sịrị na enyere m ntuziaka ka otu pati ghara inweta ebe ha ga-anọ mee ọgbakọ. Nke a bụ okpokpo ụgba n'ihi na m emeghị etu a."

Ọ gara n'ihu kwuo na ọchịchị onyekwuoucheya nyere ikike mmadụ ikwu uche ya , mana onyeghị mmandụ ikike imebi aha mmadụ ma nyekwa ohere onye e mejọrọ ịga ụlọikpe.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post

Cheta na otu NDC agabigala ọtụtụ mwakpoo na mpaghara dị iche iche n'Enugwu steeti na ọnwa ole na ole gara aha.

n'otu mwakpo a wakporo ha, a gbaruru otu onye ma merụọ ọtụtụ ndị nkwadoo pati ahụ na steeti ahụ.