Etu nwoke siri si n’ụlọelu ogogo atọ tutuo ụmụ ya na onwe ya n’ala

Aha onyonyo, Etu nwoke siri si n’ụlọelu ogogo atọ tutuo ụmụ ya na onwe ya n’ala
Etu nwoke siri si n’ụlọelu ogogo atọ tutuo ụmụ ya na onwe ya n’ala
Mgbe e biputara ya
Skip Mgbe nwuchịrị nwoke si ụlọelu tufuo ụmụ ya. and continue readingMgbe nwuchịrị nwoke si ụlọelu tufuo ụmụ ya.

End of Mgbe nwuchịrị nwoke si ụlọelu tufuo ụmụ ya.

Otu nwoke bi n'okpuruọchịchị Obingwa n'Abịa steeti, si ụlọelu ogogo atọ tufuo ụmụ ya abụọ na onwe n'ala.

Nke a mere n'obodo Umuobe, dị nso na njikọ ọkpọrọụzọ 'Barracks Junction, n'Opobo Road dị n' Obingwa, Aba, Abia steeti dịka onye agbataobi nwoke ahụ mere ihe a gwara BBC ihe o jiri anya ya hụrụ n'ubochi ahụ.

Ya bụ ihe mere n'ụbọchị Tọzde 30 Julaị 2026, tịnyere ndị bi n'agbataobi ahụ bụ ndị gbakoọrọ na ngwuru ebe ihe mere na gbagharịa.

Ndị agbataobi ya bụ ndị sere onyoonyo a kọọrọ BBC etu ha siri gbatara ezinụlọ a ọsọ enyemaka mgbe ihe mberede a na-eme.

Onye agbatobi a bụ agadị nwoke sị na mgbe nwoke a na-ekwu na ọ ga-etufu ụmụ ya, ha so na-ayọ ya ka ọ hapụ itufu ha.

Ọ kọwakwara ọtụtụ agwa dị iche iche nwoke ahụ na-akpa tupu ụbọchị ahụ ọ chọrọ igbu ụmụ ya nakwa onwe ya.

Ihe ndị uweojii kwuru

Ndị uweojii n'Abia steeti gwara BBC na ụmụaka nwoke ahụ siri n'ụlọelu ahụ tụtuo anwụghị kama ha nọ n'ụlọọgwụ na-enwete ọgwụgwọ dịka nna ha nọ n'aka ndị uweojii.

Ha sị na ụmụaka ahụ nna ha si n'elu uloelu ogogo abụọ tutuo n'ala ka dị ndụ, nna ha si n'elu daa ka dịkwa ndụ mana ha niile nwere nnukwu mmerụ ahụ.