Etu otu onye si buru Ebola gaa mba atọ n'Africa

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Wycliffe Muia
- Mgbe e biputara ya
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5
Otu onye ojiegoachụego mba Kenya nọrọ n'ebe Ebola na-akpọtụ ma si ebe ahụ gaa mba atọ ndị ọzọ tupu a mara na o bu ya bụ ọrịa.
Ọ bụ oge nwoke ahụ gbara afọ 40 dara nnukwu ahụ n'otu ụlọọgwụ dị na Naiirobi ka a chọpụtara na obu ya bụ ọrịa.
O mechara nwụọ ka abalị abụọ gachara, n'abali ise nke ọnwa Oktoba, afọ 2026, ma bụrụ onye mbụ a ma butere ọrịa Ebola na Kenya.
Na a chọpụtaghị ọrịa o bu n' ọtụtụ ụlọọgwụ dị na mba DR Congo nakwa ọdọụgbọelu Uganda nakwa nke Kenya akpalitela ajụjụ banyere etu ọrụ nche ahụike mba ndị a n' igbochi nkesa ọrịa.

Ebe foto si, EPA
Ihe karịrị mmadụ 4,000 anwụọla site n'Ebola na mba DR Congo n'afọ a, nke abụ ntiwapụ nke abụọ kachasị.
Ihe mere na DR Congo
Akụkọ nke Onyeisi gbatagbata otu Africa CDC bụbụ Dkta Wessam Mankoula ọrọ gosiri n'ụzọ were anya etu ojiegoachụego ahụ si mee njem puku kwuru puku kilomita dịka ọrịa ya na-akawanye njọ.
Nwoke ahụ nke a gbabeghị aha ya n'anwụ biri na mba DR Congo afọ asaa ma mee njem gaa mpaghara atọ na mba ahụ maka azụmahịa.
O doghị anya mgbe maọbụ ebe o butere ọrịa Ebola mana Ebola dị na mpaghara atọ ndị ahụ ọ gara na DR Congo, dịka otu ahụike mbaụwa bụ WHO si kwuo.
Na nwgụcha ọnwa Ọgọstụ na mmalite Septemba, nwoke ahụ gara obodo Buta, Aketi na Likati dị na mpaghara Bas-Uélé dị na DR Congo.
WHO kwuru n'ọnwa Ọgọst na e nwere ọrịa Ebola na Buta tupu ọ gaa ebe ahụ mana o nweghị ihe akaebe gosiri na ọ bụ ebe ahụ ka o butere ya.
Njirimara ọrịa ya pụtara n'abalị 15 nke ọnwa Septemba. A gbara ya 'antibịọtiks, sị ya lawa.

Ebe foto si, EPA
Ka abalị abụọ gachara, enyere ya akwa n'ụlọọgwụ 'Tongo Etandi Health Centre' dị na Bondo ebe ọ n orọ rue abalị 19 nke ọnwa Septemba.
Na-agbanyeghị na ahụọkụ na-ere ya , ihe wụkasịa ya n'ahụ, ndị ụlọọrụ gwara ya na ọ bụ ihe mwhụkasị akpụkpọ ahụ na-enye ya nsobu.
Dịka e nyochaghị ya ahụ maka Ebola, ọ hịara ahụ ikwu kpọmkwem, ebe ọ nọ bute ọrịa ahụ n'ije ya.
Njirmara ọrịa ọ na-egosi bụ njimara onye nwetara ọrịa Ebola ọhụrụ mana ọ bụkwa njirimara ọrịa ndị ọzọ a na-ahụ na mpaghara ahụ dịka ọrịa ịba.
N'abalị 20 nke ọnwa Septemba, o fegara Kisangani, obodo mepere emepe ọnụọgụgụ ndị bi na ya bụ otu nde na ụma ise( 1.5 million) nọọ abalị 10 dịka ọ na-achọ nleta ahụike ya.
Anyị amaghị ụlọọgwụ ndị lekọtara ya maọbụ ọgwụ ha nyere ya.
Kisangani bụ isiobodo mpaghara Tshopo dị na DR Congo enweela mmadụ 51 butere ọrịa Ebola.
Ihe mere n'Uganda
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
N'abalị mbụ nke ọnwa Oktoba, ka ọ gachara ihe karịrị izuụka abụọ nwoke ahụ ji rịawa ahụ, ọ gbara ụgbọelu ọzọ gaa n'obodo ọzọ dịkwa na DR Congo a kpọrọ Beni, bụ ebe o siri gaa Kasindi, bụ obodo na-ekwu ekwo dị n'okeala DR Congo na Uganda.
Obodo Beni na Kasindi dị n'Ugwu Kivu, enweela ọrịa Ebola metụtara mmadụ 1,755 nke mmadụ karịrị 1,000 nwụrụ site na ya nke mere ya mpaghara Egbola kachasị metụta na DR Congo.
Mana ọ nọteghị aka ebe ahụ tupu ọ gafee gaa Uganda.
Uganda tinyere mmachi na ngagharị n'ọnwa Mee n'oke ha na DR Congo dịka mba ahụ nwere ntiwapụ ọrịa.
Uganda agbaliala igbochi ntiwapụ Ebola site na nnyocha ndị na-abata, ịchọ ndị ha na ha mekọtara na iwezụga n'akụkọ ndị a na-enyo enyo bu ya.
N'afọ a, ha enwetala ụfọdụ ndị bu ya nke ọtụtụ n'ime ha bụ ndị si DR Congo.- mana n'ọnwa Ọgọstụ, e kwuru na o nweghịkwa onye ọzọ bu ya na mba ahụ.
Mana okeala mba abụọ ahụ toro ogologo rue ọtụtụ kilomita bachara ime ime obodo nke mere ya o sie ike anya ndị uweojii iru ebe niile.
O doghị anya na ojiegoachụego ahụ ọ gafere ebe ndị ọrụ ahụike na-enyocha ndị njem oge ọ gafetara Uganda.
Ka o rutere Uganda, o mere njem okporoụzọ gaa isiobodo ha bụ Kampala, ma gaa ọdọụgbọelu "Entebbe International Airport' bụ ebe ọ bara ụgbọelu na-aga Nairobi, Kenya n'abalị atọ nke ọnwa Oktoba.
Ndị ọrụ ahụike mba Uganda kwuru na ahụ ya dịka nke onye ahụ dị mma oge ha chọrọ ma ahụ ya adị ọkụ n'ọdọụgbọelu .
Ndị ọkachamara ahụike kwuru na ihe mere n'okwu nwoke ahụ gosiri na ile ma ahụ mmadụ ọdị ọkụ nakwa iche a mmadụ kwupụta na o nwere ọrịa ezughị igbochi nkesa ọrịa a.
Mankoula kwuru na a na-enyocha ma ọgwụ e nyere nwoke ahụ o soro mee ka ahụọkụ ya dajụrụ. O kwuru na o nwere ike ahụọkụ ya dajụru oge ọ gafere ọdọụgbọelu ebe e nyochara ya.
Ihe mere na Kenya
N'otu aka ahụ, a chọpụtaghị na nwoke ahụ bu Ebola oge ọ wuchiri n'ọdọụgbọelu Jomo Kenyatta International Airport dị na Naijrobi,isiobodo Kenya ,ebe nwannne ya bịara buru ya buga ya kpọmkwem n'ụlọọgwụ abụghị nke gọọmentị na-etinyeghị isi ebe ọzọ.
Oge ahụ nwoke ahụ na-arịazi ahụọkụ, oyi ọmụma, ahụ ụfụ, ọnya akpịrị ma na-agba ọbara .
Nyocha e mere ya gosiri na onwere ọrịa ebola ụdị nke a kpọrọ "Bundibugyo" bụ nke na-akpa ike na DR Congo.
E dowere ya iche dịka ọnọdụ ya na-akawanye njọ. Ọ nwụọ n'abalị ise nke ọnwa Oktoba, elie ya nna ụbọchị so ya n'ụzọ iji gbochie nkesa ọrịa.Gọọmentị mba Kenya kwuruna ha chọtala mmadụ 66 ha n nwoke ahụ zutere malie oge ọ batara Kenya.
WHO kwuru na ọnụọgụgụ ndị ọ zutere ga-akarị nke dịka a na-achọ ndị ya na ya jekọrọ na Uganda nakwa DR Congo.




























