Ndị uweojii: Anyị na-achọ dọkịta pịara nọọsụ ihe

Dokịta

Ebe foto si, Getty Images

Mgbe e biputara ya

Ndị uweojii nọ na Legọs ekwuola na ha na achọ Dọkịta tiri nọọsụ ihe n'ụlọọgwụ, Awoyaya Hospital,dị n' Ibeju Lekki, Legọs.

Akụkọ kwuru na otu dọkịta na-arụ n'ụlọọgwụ ahụ a kpọrọ Dkta Emmanuel Okolo pịara nọọsụ Dorcas Adeyera ihe maka nghọtaghie dapụtara na ịnabata onye nwere mberede okporoụzọ e butere n'ụlọgwụ ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Chike Oti kwuru na ha "na-achọ" nwa amadị ahụ.

Adeyera boro Dkta Okolo ebubo na ọ sekpubere ya ala, maa ya ụra ugboro ugboro ma pịakwa ya mgbadoukwu(belt) n'ihi na ọ nabatara onye nwere ihe mberede okporoụzọ na anataghị ikike n'aka ya.

Nọọsụ ahụ nke degara onyeisi ụlọgwu ahụ ozi mkpesa, gakwara kpesa ya n'ogige ndị uweojii.

Ka ọ dị ugbua, mbọ BBC gbara inweta ọnụ okwu dọkịta ahụ amịtabeghị mkpụrụ oge anyị dere anyị bipụtara akụkọ.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ

Anyị ga-ewetara ụnụ akụkọ ka o si aga.