Liverpool vs Chelsea: A pịala Chelsea ụtalị mmụọ

L:iverpool

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Liverpool na-aṅụrị mgbe Salah nyere goolu
Mgbe e biputara ya

Chelsea dutere Liverpool ahịa makana ha agbaghị aka ahịa maọlị mgbe ha zutere n'ọgbọ ọgụ Anfield.

Sadio Mane bu ụzọ ji isi tinye bọọlụ na mpio mgbe ọ kụrụ nkeji iri ise na otu (51").

Ka nke a mechere, ọ dị ka goolu Mane amụnyere Mohamed Salah ọkụ nke ịhụnanya mere o jiri nọrọ n'oteaka 18 yada were pịanye shọtụ n'aka eru nwata Kepa Arrizabalaga bụ oche goolu ndị Chelsea na nkeji 53".

Agụ nwoke Salah, nyere ihe a hụrụ dịka goolu ya kacha mma kemgbe ọ gbawara Premier League, bụ nke mere ya goolu iri na itoolu ọ na-enye na Premier League n'afọ a.

Goolu a zuru ịkpọ ndị Chelsea ntu n'obi, makana nke a bụ mbụ a na-emeri ha n'Anfield kemgbe afọ 2012.

Chelsea nwara ihe niile ha nwere ike ka ha sata otu goolu, mana Liverpool kpachiri ike nke bere asọmpị ahụ na 2 - 0.

Chelsea ka nọ n'ọkwa anọ na tebulu, mana ma ha a ka ga-anọ ma ha a ga-arịda, dị n'aka Arsenal ka ga-ezute Watford.

Akụkọ ga-amasi gị