Ihe mere m ji nye Akwa Okuko mgbaghara 'pardon' ma mee ya Ambassador - Governor Soludo

Ebe foto si, BBC/Akwa Okuko/Facebook
- Onye dere ya, Michael Ngene
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Mgbe e biputara ya
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3
Aka na-achị Anambra state bụ Charles Chukwma Soludo agwala BBC News ihe mere o jiri nye nwaamadị gọọmenti ya nwụchiri maka ebubo ime ọgwụ okeite, tụọ ya mkpọrọ mgbaghara 'pardon' ma mee ya Ambasaador na state ya.
Gọvanọ Soludo kọwara na na mbido, gọọmenti nwere ebumnobi ime ka Anambra state bụrụ Dubai-Taiwan-Silicon Valley kama na iji mezuo nke, e kwesịrị ikpochapụ ụfọdụ ndị na-ete Anambra state uyi n'ihu.
"Ndị Igbo na-asị na ọ bụ aka aja aja na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ. Mana a nọgideziri ọ bụghịzi aka aja aja na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ. A naghịzi akpata ego akpata, ọ bụ mbute ka a na-ebute ya. Nke a mere ka mpụ na-adị n'obodo. Ọ banyekwara n'ime ụlọụka. I bụrụ Igbo na ọgwụike ndị ọzọ ị ga ree na mba ndị ọzọ, e mere gị ọgwụ, igwe eji achọpụta ya n'ọdọụgbọelu ekpuo isi. Ọ gaghị ejide gị," ka o kwuru.
Ọ kọwara etu nke a si emetụta ụmụafọ Anambra state ma kwuo na gọọmenti ya ji maka nke a chepụta iwu ga-egbochi ndị ntorobịa Anambra a na-etinye aka n'ụdịrị ajọ omume ndị ahụ.
"Ihe ndị a mere ụmụaka anyị nwee ju n'ụlọ nga jụrụ obodo onyibo niile ma ndị ntorobịa ọkachasị ụmụaka Anambra be anyị. Asịrị m mba. I gaghị asị na ị chọrọ ka be anyị bụrụ Dubai-Taiwan-Silicon Valley, ọ bụghị etu a. Ọ bụ ya mere anyị ji wepụta iwu nke mere ka ọ bụrụ mpụ ime ihe dị ndị ahụ. Kemgbe anyị malitere ịchụ ha, ndị na-agwọ okeite ma ndị pastọ na-eji ihe ịrịbaama adirigboroja akpa ego. Nke a abụghị ikpe ụka. Ọ bụ ọrụ dịịrị anyị ichekwa obodo anyị n'aka onwe ya.
Ọ bụ nke a mere ka gọọmenti ji mepụta iwu Anambra State Homeland Security Law 2025 n'ọnwa Jenụwarị 2025.
N'ọnwa Febụwari 2025, gọọmenti Anambra state nwụchiri mmadụ atọ gụnyere Akwa Ọkụkọ, Onyeze Jesus na Eke-Hit maka ebubo ịgwọr ọgwụ okeite, inwe mmekọ ha na ndị na-ebu ọgwụ ike, na ịgwọrọ ndị ntọ ọgwụ nke megidere iwu nke Anambara steeti.
A kpụpụrụ ha n'Ụlọikpe Ukwu dị n'Awka, isi obodo Anambra state ebe a nọ tụọ Chidozie Nwangwu a ma ama dịka 'Akwa Ọkụkọ' mkpọrọ ọnwa iri na otu maka ebubo metụtara ịgwọrọ ndị mmadụ ọgwụ ego nke a kpọrọ 'Okeite'.
Mana na Septemba 18, 2026, Gọvanọ Soludo nyere Akwa Okuko mgbaghara 'pardon', nke mere ka ọtụtụ mmadụ malite ịjụ ajụjụ ihe kpatara nke a.
Gọvanọ Soludo gwara BBC ihe mere o jiri nye ya mgbaghara ahụ ma kwuo ka a tọhapụ ya n'ụlọ mkpọrọ.
"Tupu e kpee ikpe Akwa Okuko, o ji aka ya gosi na o nwere mwute na nchegharị n'ihe ọ na-eme na ya agaghị emezi ya ọzọ. Biko ka e meere m ebere. Ihe mbụ bụ na e belatara ikpe a mara ya. E belata ya maka na ihe o kwesịrị ịnọ ebe ahụ bụ opekatempe afọ isii."
Gọvanọ Soludo kwuru na: "O kwesịrị ịpụta n'ihe dịka ọnwa na-abịa mana ụbọchị ahụ, agara m nleta ma hụ ya ebe ahụ. M wee sị ka a kpọpụta ya ụbọchị ahụ. Ya onwe ya kwetara na ọ ga-eso dịka Ambassador ga na-akọrọ ụmụaka ndị ọzọ na uru adịghị n'ihe ndị ahụ. Ka onye ọbụla laghachi azụ ma chọọ ihe ọ ga-arụ. Ị ga-elu gaa ala, gaa ala gaa elu, ọ bụ aka aja aja na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ."




























