Ihe i kwesịrị ịma gbasara ‘localized nodule’ e wepụrụ na ngụgụ Pope
Ama m na ka ọ dị ugbua, ị nụla na Onyeisi Ụka Katọlik n'ụwa niile bụ Pope Leo XIV nwere ọrịa kansa na ngụgụ ya.
Vatican kwuru na e ji nkeji 90 waa Pope dị afọ 71 ahụ n'ụlọọgwụ Gemelli Hospital dị na Rome iji wepụ mpaghara ala nke ngụgụ aka nri ya.
Nke a na-abịa dịka Pope nọọrọ n'ụbọchị Sọnde kwuo na ndị dọkịta ya hụrụ obere akpụ na ngụgụ ya bụ nke a kpọrọ 'nodules'.
Ugbua, i nwereike na-ajụ gịnị bụ 'localised nodule' a sị Pope nwere?
Ngalaba ahụike a kpọrọ National Cancer Institute kọwara 'nodule' dịka akpụ nke nwereike bụrụ kansa maọbụ akpụ nkịtị.
Oge anyị kpọtụụrụ Dọkịta ezinaụlọ bụ Dr Victor Dike, ọ gwara anyị na "localised nodule" bụ akpụ nke na-anọdụ otu ebe.
O kwuru na ọtụtụ ndị mmadụ nwere nodules na ngụgụ ha, mana ọ bụ mgbe ha gara ime nnyocha X-ray maọbụ CT-Scan ka a na-ahụkarị ya.
Dr Dike kọwara na ọ bụ etu akpụ ahụ ha nakwa ihe ndị ọzọ a ga-enyocha ga-ekwu ma ọ bụ kansa ma ọ bụkwanụ ihe ọzọ, dịka ọ gbakwunyere na a sịgodu na akpụ ahụ bụ kansa, na a ga-awa ma wepụ ya, ka onye ọ nọ n'ahụ ya nwere onwe ya n'ihi na ọ nọ naanị otu ebe.



