Bianca Andreescu: Nwa dị afọ 19 anarala Serena Williams ụra rahụ

Williams

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Williams adaala na agba ikpeazụ asọmpị anọ
Mgbe e biputara ya

Nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu akpọrọ Bianca Andreescu anarala Serena Williams ụra rahụ site n'ịmabụrụ iko US Open nke 2019.

Mmeri a napụrụ Williams ohere ọ kara iji mabuo iko 'Grand Slam' nke iri abụọ na anọ ya.

Iko a bụ 'Grand Slam' nke mbụ Andreescu bụ onye Canada mabuterela kamgbe ọ malitere ịkụ bọọlụ Tenisi.

Bianca

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nke a bụ mbụ Andreescu na-amabute iko 'Grand Slam'

Williams onye dị afọ iri atọ na asaa emenwụghị ọtụtụ ihe Andreescu onye ọbara ya ka na-apụ ọkụ mere n'asọmpị ahụ.

"Afọ a abụrụla nrọ bịara na mmezu," bụ okwu pụrụ n'ọnụ Andreescu mgbe o merichara.

Andreescu onye gosiri obi ụtọ ya nke ukwu kwuru na ọ bụrụ ya nnukwu mbụlịelu na ya na Serena Williams sọkọtara mpi na US Open nke afọ 2019.

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Awgu Caves: Ọgba ndị a chere ndụ ndị Mmaku n'oge gboo

Akụkọ ndị ga-amasị gị: