Ihe ise dị mkpa Inec kwesịrị ịmụta site na nnwale ntuliaka 'mock election'

Ụlọọrụ Inec haziri nnwale ntuliaka na mpaghara dị iche iche na Nigeria n'ụbọchị Satọde abalị 28 nke ọnwa Nọvemba 2026
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Nnwale ntuliaka ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Nigeria bụ Independent National Electoral Commission' (Inec), mere na Nigeria n'ụbọchị Satọde abalị 28 nke ọnwa Nọvemba 2026 ekpughela ọtụtụ ihe dị iche iche gbasara njikere ụlọọrụ ahụ maka ịhazi ntuliaka nke afọ 2027.

Cheta na ụlọọụ Inec haziri ntuliaka ahụ iji nwalee akụrụngwa Inec bụ 'BVAS' na usoro e si ezipụ mpụtara ntuliaka n'ịntanetị bụ (IReV), iji hụ na ha na-arụ ọrụ nke ọma tupu oge ntuliaka nke afo 2027.

Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị sonyere na nnwale ahụ toro etu akụrụngwa 'BVAS' si rụọ ọrụ nke ọma, e nwekwara ọtụtụ mkpesa and nsogbu ndị dapụatara n'oge nnwale ntuliaka ahụ.

Nsogbu ndị a gụnyere teknụzụ, abịaghị n'oge nke ndị ọrụ Inec, aha ụfọdụ ndị mmadụ na-apụtaghị n'akwụkwọ ndekọ ntuliaka, nakwa obere ọnụọgụgụ ndị pụtara maka nnwale ntuliaka ahụ.

Ihe ise pụtara ihe na nnwale ntuliaka a

Ihe ise pụtara ihe n'oge nnwale ntuliaka a gụnyere:

1. Nsogbu akụrụngwa BVAS n'ebe ụfọdụ

N'agbanyeghị na onyeisi ụlọọrụ Inec bụ Joash Amupitan, kwuru na akụrụngwa BVAS rụrụ ọrụ nke ọma karịa ka ọ dị na mbụ, ụfọdụ ndị sonyere n'ime ntuliaka ahụ nyere mkpesa na akụrụngwa ahụ enweghị ike ịmata mkpịsị aka maọbụ ihu ha.

Na Kano, otu akụrụngwa BVAS gosiri na paswọọdụ e tinyere ezighị ezi, ebe otu onye ji kaadị ntuliaka kemgbe afọ 2011 na Niger state enweghị ike ime nnyọcha ya n'ihi na akụrụngwa ahụ jụrụ ịmata mkpịsị aka na ihu ya.

2. Abịaghị n'oge nke ụfọdụ ndị ọrụ Inec

N'ebe ụfọdụ, ndị pụtara maka nnwale ntuliaka Inec chere ọtụtụ awa tupu ndị ọrụ Inec erute n'ebe ntuliaka, mana n'ebe ndị ọzọ ndị ntaakụkọ BBC gara nleta, ha ahụghị onye ọrụ Inec ọbụla.

N'okpuru ọchịchị Onitsha North dị n'Anambra state, nnwale ahụ amalitebeghị mgbe onye ntaakụkọ BBC News rutere n'ụlọakwụkwọ Ezechima Primary School III, St Charles College, na DMGS I n'elekere iri nke ụtụtụ Satọde; ahụghịkwa ndị ọrụ INEC maọbụ ngwa ọrụ nnwale ọbụla.

Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka a hụrụ na Community School Amawbia, ebe onye ntaakụkọ BBC rutere n'elekere 8:50 nke ụtụtụ ma chọpụta na a kpọchiri ọnụ ụzọ ụlọakwụkwọ ahụ, ahụghịkwa onye ọrụ Inec ma ọ bụ onye ntuliaka ọbụla.

Na Kaduna, otu onye ntuliaka kwuru na ya ruru n'ogige ntuliaka n'elekere 7:30 nke ụtụtụ, mana ruo elekere 11:00 nke ụtụtụ, ndị ọrụ Inec abịabeghị.

3. Ọtụtụ ndị ntuliaka apụtaghị maka nnwale ahụ

Ọzọ bụ n'ọnụọgụgụ ndị pụtara maka nnwale ahụ dị ntakịrị nke ukwuu n'ọtụtụ steeti.

N'Ondo, ọ bụ naanị mmadụ abụọ n'ime mmadụ 470 debanyere aha n'otu ogige ntuliaka sonyere, ebe mmadụ 11 n'ime mmadụ 940 pụtara n'ogige ntuliaka ọzọ.

Na Benue state, mmadụ 11 n'ime mmadụ 754 sonyere n'otu ebe, ebe mmadụ isii n'ime mmadụ 833 sonyere n'ebe ọzọ.

Ọtụtụ ndị kwupụtara na ihe kpatara obere ọnụọgụgụ a bụ enweghị ezigbo mgbasa ozi na nkuzi zuru oke gbasara nnwale ntuliaka ahụ.

4. Ahụghị aha ụfọdụ ndị ga-atụ vootu n'akwụkwọ ndekọ aha

Nnwale ahụ gosikwara na ụfọdụ ndị nwere kaadị ntuliaka enweghị ike ịhụ aha ha n'ebe ha gara ime nnyocha.

Na Jigawa, ụfọdụ ndị sonyere kwuru na ha enweghị ike ịhụ aha ha n'akwụkwọ ndekọ aha ebe ha chere na ha kwesịrị ịtụ vootu.

Ụfọdụ ndị ntuliaka chere na a gbanweela ogige ntuliaka ha, ma rịọ Inec ka ha na-eme ka ọha na eze mara nke ọma tupu ha agbanwee ebe mmadụ ga-atụ vootu.

5 . Inec kwuru na e nwere ọganihu na teknụzụ ya

N'agbanyeghị nsogbu ndị a hụrụ n'ebe ụfọdụ, onyeisi ụlọọru Inec bụ Amupitan, kwuru na afọ juru ya maka ọganihu e nwere n'iji mkpịsị aka na ihu amata ndị ga-atụ vootu.

O kwuru na ndị akụrụngwa BVAS na-amataghị mkpịsị aka ha nwere ike iji ihu ha gaa n'ihu n'usoro nnyọcha ahụ.

Na Lagos, Kọmịshọna Inec na steeti ahụ bụ Ayobami Salami, kwuru na nnyọcha otu onye ga-atụ vootu na-ewe ihe na-erughị otu nkeji n'ogige ndị ọ gara nleta.

INEC kwuru na ihe a chọpụtara na nnwale ahụ ga-enyere ya aka idozi nsogbu ndị chọpụtara tupu ntuliaka nke afọ 2027.