Alex Ekubo: Ezinaụlọ ya ekwupụtala ihe gburu ya kpọmkwem ma sị na ọ lụrụ nwaanyị tupu ọ nwụọ

Alex Ekubo nwụrụ site n'ọrịa kansa nke ogogo ya dị elu.

Ebe foto si, Alexx Ekubo/Instagram

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ezinaụlọ Alexx Ekubo onye ome ihe nkiri Nollywood nwụrụ anwụ ekwupụlata kpọmkwem ihe gburu ya.

N'ozi ha wepụtara n'akara Instagram nwamadị a kọwara na ha ji "obi ọjọọ na nwute e kwupụta ọnwụ di anyị, nwa anyị, nwanne anyị nakwa enyi anyị bụ Alexx Ikenna Ekubo-Okwaraeke."

Ha kọwara na Ekubo nwụrụ dịka ọ rịachara ọrịa kansa akụrụ a kpọrọ 'metastatic kidney cancer' nke ogogo ya gbagoro elu.

Ha kwuru na nwamadị ji obi ike na olileanya na okwukwe n'oge ọ na-arịa ọrịa ahụ na ọ ga-agbake n'otu ụbọchị ma tụọ mm amma.

Ha rịọrọ ka onye ọbụla kwanyere ezinaụlọ ya ugwu n'oge iru uju a ma sị na a ga-ewepụta ozi banyere emume olili ya.

Ha gakwaea n'ihu rịọ ka e kpeere ezinaụlọ ya ekpere nakwa nye ha nkwado zuru oke n'oge iru uju a.

Akụkọ ọnwụ ya malitere ifegharị na mgbede Tuzde kwuru na Ekubo bụ onye zara 'Paul' n'ihe ejije, 'Ahamefuna', nwụrụ n'ụlọọgwụ akpọghị aha ya dịka ọ rịchara ọrịa nwa mgbe nta.

Alex Ekubo

Ebe foto si, ALEX EKUBO / FACEBOOK

Nkọwa foto, Alex Ekubo

Ihe Kate Henshaw, Uche Jombo,Regina Askia, ndị ọzọ na-ekwu maka ọnwụ ya,

ALEX EKUBO

Ebe foto si, ALEX EKUBO / FACEBOOK

Nkọwa foto, ALEX EKUBO

Dịka akụkọ ọnwụ ya gbara na soshal midia, ọtụtụ ndị ogbo ya atụọọla arịrị maka ọnwụ Alex Ekubo.

Otu n'ime jha bụ Kate Heshaw chetara na " Ị pụtara m oge nne m nwụrụ afọ abụọ gara aga."

" M na-achọ ohere m ga-eji gwụọ gị ụgwọ Obioma gị, mana ọ bụghịzịnụ otu a,Alex."

N'okwu ya, Uche Jombo sí n'ọnwụ Alex riri ya ọnụ.

Chioma Akpotha, Regina Askia na Uche Jumbo

Ebe foto si, Chioma Akpotha/Regina Askia/Uche Jombo/Instagram

Jombo sịrị, "Rahụ n'udo, Ikuku. O kwebeghị ikweta na o mere."

Regina Askia sịrị, " E nwere ụfọdụ ndị mmadụ ga-abị ha bata, tupu ha ekwuo okwu, a marala na ha batara. Alex so n'otu n'ime ha."

Askia onye rotere nkwado pụrụ iche Alex nyere ya, kọwara ya dịka 'enyi onye ọbụla"

Ọ gara n'ihu tụọ arịrị sị, "Ugbua, naanị n'afọ 40, ife a na-achake lara n'ike."

Chioma Akpotha sịrị,"Alex,ezigbo nwanne m nwoke, laa n'udo."

Ihe I kwesịrị ịma maka Alex Ekubo

Alex Ekubo

Ebe foto si, Alex Ekubo/Instagram

Nwaafọ Arochukwu dị n'Abia steeti, a mụrụ ya n'abalị iri nke ọnwa Epreelu 1986 na Pọtakọt.

Nne na nna ya bụ Maazị na Oriaku Okwaraeke bi na Surulere,Legos ebe Ekubo nọrọ too.

Alex gụrụ maka iwu na mahadum 'University of Calabar' dị na Krọs Rịvas steeti.

Alex bidoro ịpụta n'ejije n'afọ 2003, mana ejije mbụ ọ pụtara na ya bụ nke a na-akpọ "Sinners in the house '2003)".

Ihe ejije ndị ọzọ o sonyerela na ya gụnyere 'Lagos Cougar", "Ladies Men" wdg.

E wezuga ime ihe ejije, Ekubo bụ onye e ji ihu ya ere ahịa nke Bekee kpọrọ 'Model'.

Cheta na aha Alex wuru ewu na soshal midia n'afọ 2021 dịka nwaagbọghọ ọ chọrọ ịlụ bụ Fancy Acholonu pụtara n'ọha gbaa Alex arụgbaghịm.