Queen's University ekwupụtala na aka Jason Arday dị ọcha n'ebubo nrụrụaka e boro ya

- Onye dere ya, Peter Coulter
- Ndị mere akụkọ a, BBC News NI
- Mgbe e biputara ya
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3
Nnyocha nke ọkammụta Jason Arday mere, bụ nke e boro ya ebubo na o mere nrụrụaka na ya, enweghị nrụrụaka ọbụla dị na ya, dịka otu nnyocha nke Queen's University Belfast hibere siri kwupụta.
QUB malitere ileba anya n'ọrụ Jason Arday dịka ọ gbachara arụkwaghị n'ọrụ ya na Mahadum Cambridge maka ebubo na ọrụ ya akwụghị ọtọ.
N'ozi nke QUB wepụtara, ha kwuru sị: "Anyị elebala anya n'okwu a, afọ juru anyị na nnyocha ahụ (nke Jason Arday mere) gbasoro usoro niile tozuru etozu maka nnyocha agụmakwụkwọ, anyị enweghị ịtụ uche ọbụla banyere ya."
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
N'afọ 2023, Arday bụụrụ onyeisi ojii afọ ya kacha nta ga-abụ ọkammụta na Mahadum Cambridge.
Mana n'ọnwa Ọgọst afọ a, a hụrụ ozu ya n'ụlọ ya dị na Battersea, dịka ọ gbara arụkwaghị m na mahadum ahụ otu izuụka gara aga.
Ọnwụ nwa amadị a gbara afọ 41 bịara dịka ụlọntaakụkọ dị icheiche busara ebubo nke otu onye boro na Arday si ebe ọzọ nnyopụta ihe ndị o dere na nnyocha ya maka ntozu oke nzere PhD.
Nnyocha ka na-aga n'ihu ugbua ịchọpụta kpọmkwem ihe butere ọnwụ ya.
Prime Minister mba United Kingdom bụ Andy Burnham kọwara ọnwụ ọkammụta a dịka ihe mgbawa obi n'ụzọ niile.
Onye mbụ bulitere ebubo nrụrụaka megide Arday nakwa ọrụ ya bụ otu nwoke aha ya bụ Nathan Cofnas, onye bụkwa onye na-eme nnyocha na mba America, ma bụrụkwa onye kpọrọ onwe ya onye na-ekwu okwu gbasara agbụrụ etu o si dị.
Cofnas edebuola na ndị isi ojii enweghị ọgụgụ isi na ịma akwụkwọ ka ndị agbụrụ ndị ọzọ, ma kwuo na ọ bụrụ ebe a na-enye mmadụ ihe ruuru ya, agaghị ahụ onyeisi ojii ọbụla n'ọkwa dị elu ma ọ bụghị naanị n'egwuregwu na ịkpa obi ọma.
O kwuru na ya tinyere ọrụ Arday n'igwe na-enyochapụta nrụrụaka n'akwụkwọ nnyocha, wee chọpụta na "ọtụtụ ihe Arday dere bụ nke o si n'ebe ọzọ nyote na-enweghị mgbanwe ọbụla, oge ụfọdụ ọ hapụkwuru ma ndehie nke ndị mbụ depụtara ihe ahụ n'ime ederede nke ya".
Ka Arday nwụchara, Mahadum Ghent ebe Cofnas na-arụbu ọrụ kwụsịtụrụ ya ọrụ ma kwuo na ha ebidola inyocha ya maka "ịkpa oke" megide ọkammụta Cambridge ahụ. Ha mechara machie ya ịkuzi ihe ruo ọnwa atọ.
Ndị a ma ama nakwa ndị enyi Arday akpọọla oku ka e lebakwa anya n'etu ndị ọrụ mgbasaozi si busaa akụkọ gbasara ọkammụta Arday tupu ọnwụ ya.
Diane Abbot bụ onye omeiwu na pati Labour na mba England nakwa Jameela Jamil na-eme ejije, so na mmadụ 30,000 binyere aka n'akwụkwọ e degaara Prime Minister, bụ ebe ha kwuru na Arday nwụrụ dịka e busoro ya agha akwụsị akwụsị ihe ruru izuụka abụọ.
Mahadum Cambridge ehibela otu nnyocha iji mara enyemaka Arday nwetara dịka ọ gabigara ọtụtụ mmekpa ahụ tupu ọ nwụọ, nakwa ihe niile gbasara oge ọ nọrọ na mahadum ahụ.
Mahadum Liverpool John Moores - bụ ndị nyere Arday nzere OhD na 2015 - kpebikwara ka ha mechara nnyocha n'ọrụ ya kwụ ọtọ.
Ọtụtụ Mahadum ndị ọzọ dịka Mahadum Glasgow, Mahadum Durham na Mahadum Queen's Belfast malitekwara nnyocha nke ha gbasara ọrụ Arday nakwa etu e si nye ya ọkwa ndị ọ nọrọ na ya na mahadum ndị a.

























