Etu agha na esemokwu dị na mba Cameroon si metụta ndụ ndị mmadụ

Nwaanyị nwere ọtụtụ apa n'ihu ya nke bidoro n'egedege ihu ya ruo n'imi ya na ọnụ ya. Imi ya dịka ọ agbakwụnyere ya agbakwụnye site n'ịwa ahụ
Nkọwa foto, Ndị ojiegbe a na-amaghị ndị ha bụ gbara Median Bah egbe ọtụtụ ugboro n'ihu ya
    • Onye dere ya, Paul Njie
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Africa
    • Ebeg o si, Ogoja
  • Mgbe e biputara ya
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 7

Median Bah dị nannị afọ 15 oge ndụ ya gbanwere kpamkpam.

O chetara ụbọchị ihe ahụ mere - 7 Eprel 2018. Ọ nọ n'akwa ọrịa ya.

Ndị ojiegbe wakporo ezinaụlọ nna ya dị na mpaghara ndịda anyanwụ mba Camerron bụ otu n'ime mpaghara abụọ a na-asụ asụsụ Bekee na mpaghara agha na esemokwu ahụ dapụtara.

Median dị afọ 23 ugbua, kwuru na ọ na-ehi ụra oge nwanne ya nwoke bịara kpọtee ya maka egwu sitere n'egbe ndị ojiegbe ahụ na-agba aghara aghara.

Nwanne ya nwoke si na mpio ụlọ ha gbapụ mana ịgba ọsọ adịghịrị Median mfe.

"Anọ m n'ọrịa, ike adịghị m isi na mpio ahụ gbapụ dịka nwanne m nwoke si mee, ọ bụ ya mere m jiri siri n'ụlọ ụzọ," ka ọ gwara BBC.

Nke a bụ ihe butere oke ihe mgbu.

O kwuru na o zutere ndị ojiegbe abụọ n'azụ ụlọ ha ndị malitere ịgba ya egbe ọtụtụ ugboro.

Ha bu ụzọ gbaa ya egbe n'ụkwụ tupu ha gbaa ya ọtụtụ mgbọ ndị ọzọ nke bibiri ihu ya.

"Ana m arịọ ha biko ka ha ghara igbu m maka na ahụ adịghị m. Mana ahụrụ m onwe n'ala," ka o kwuru.

Ọchịchịrịị gbara ebe niile. Ọ kwụsịrị inweta onwe ya ma ghara inwe ike ikwu okwu maọbụ hụ ụzọ.

Na mbụ, Median chere na ọ na-arọ nrọ.

"Mana ọ tụrụ m n'anya oge m chọpụtara na ọ bụghị nrọ."

Mwakpo ahụ merụrụ ya ahụ n'ihu, bibie eze ya niile ma mebie ọnụ ya.

Ụmụnwoke abụọ yi uwe ndịagha nakwa uwe na-egbochi mgbọ, okpu na-echekwa isi bu egbe kwụrụ n'ụzọ
Nkọwa foto, Esemokwu a malitere n'afọ 2016 oge ndị mba Cameroon na-asụ asụsụ Bekee buuru egbe maka ebubo mwakpo na mmekpahụ gọọmenti ha na-asụ asụsụ French na-emekpa ha

N'ime afọ asatọ gara aga, a waala ya ahụ ugboro anọ na mba Cameroon, Ghana na India, ebe a na-atụ anya ndị ọzọ n'afọ na-abịa abịa.

E ji anụ ahụ si n'akụkụ ahụ ya ndị ọzọ rụgharịa ihu ya.

O nweghịzi ike iji imi na ọnụ ya kuo ume nke ọma. A wara ya ahụ bekee kpọrọ 'tracheostomy,' nke bụ iji mepee akụkụ olu ka o jiri ya na-eku ume.

Kemgbe afọ asatọ, ọ bụ akụrụngwa 'tube' ka o ji eku ume. Ọ bụ na nso nso a ka e wepụrụ ya.

Agha a ruru afọ iri emetọọla ndụ ndị na-eto eto, gbochie ụmụakwụwkọ ịga akwụkwọ, chụpụ ndị nne n'ụlọ ha ma metụta ọtụtụ ndụ ndị mmadụ.

Agha a bidoro na Ọktoba 2016 oge ndị ọkaiwu na ndị nkụzi na-asụ asụsụ bekee na mba Cameroon gbara abụbụọrụ maka ebubo mmekpa ahụ ndị na-asụ asụsụ bekee n'aka gọọmenti nke ọ bụ ọtụtụ ndị na-asụ asụsụ French nọ n'isi ya.

Ngagharịiwe ha mere bụ nke malitere n'udo dịka ọtụtụ puku n'ime ha na-akpọ oku ka e nye ndị na-asụ asụsụ bekee n'ime ha ohere zuruoke.

Otu na-ahụ maka nchekwa ikike dịịrị mmadụ boro ndị ọrụ nchekwa ebubo iji aka ike kpagbuo ma megide ndị ngagharịiwe. Ọ bụ nke a mere o ji dị mfe ka ndị ojiegbe malite mwakpo ha.

N'afọ 2017, ọtụtụ otu ndị ojiegbe karịrị 12 sepụtara isi dịka nnyocha International Crisis Group siri kwuo, ma na-akpọ oku maka nwereonwe mpaghara abụọ ahụ na-asụ asụsụ bekee nakwa ka e kewapụta steeti ọhụrụ a kpọrọ Ambazonia.

Kemgbe ahụ, ndịagha nnupụisi ebuola agha n'etiti ha na ndịagha gọọmenti.

Akụkọ otu dị iche iche wepụtara kwuru na e metọọla ọtụtụ ndị mmadụ.

Otu Human Rights Watch kwuru na e gbuola ihe ruru mmadụ 6,000 kemgbe agha ahụ malitere.

Ụlọọrụ UNHCR kwuru na ndị mba Cameroon ruru 70,000 ahapụla ụlọ ha gbaga na Nigeria iji chekwaa ndụ ha.

Nwaanyị na-ele igwe kamera e ji ese foto anya
Nkọwa foto, Gloria Akom so na mmadụ 15,000 hapụrụ mba Cameroon ma gbaga Cross River state dị na Nigeria

Glory Akom gbara afọ 44, bụ onye nwere nkwarụ nke sitere n'ọkụ gbara ya.

Nwaanyị a nwere ụmụaka abụọ, bi n'ogige ndị gbara ọsọ ndụ dị n'Ogoja dị na Cross River state nke ha na mba Cameroon nwere okeala.

Richard Effiong si ụlọọrụ UNHCR gwara BBC na ihe ruru mmadụ 15,000 nọ n'ogige ndị gbara ọsọ ndụ dị n'Ogoja.

UNHCR enyela ndị gbara ọsọ ndụ ụlọ nakwa gbangbam na-ekpochi ya.

Ndị ọzọ na-eche ka ha nwere ike ịlaghachi n'ụlọ ha.

Glory kwuru na ndụ ya na Cameroon ka mma. O nwere ụlọ azụmahịa nke na-enye ya ego o ji azụ ezinaụlọ ya.

Mana ihe niile agbanweela kemgbe afọ 2017.

O kwuru na ndịagha e zigara na mpaghara ha, chụpụrụ ndị niile bi ebe ahụ ma chụbanye ha n'ime ọhịa nke mere ka ha hapụ ụlọ gbaa ọsọ gbabanye Nigeria.

"Anyị na-agba ọsọ ma na-ehi ụra n'ime ọhịa. n'ihi na anyị na-agba ọsọ."

"I hie ụra n'ụlọ gị, ha nwereike igbu gị".

Dịka ndị ọzọ gbara ọsọ ndụ, ọ bụ $67 dọla UNCHR na-enye Glory kwa ọnwa ọbụla ka o ji eleta ezinaụlọ ya nke otu n'ime ha nwere ọrịa sickle cell ma bụrụ onye kwesịrị inweta nleta.

Ego a anaghị ezuru ya ịzụta nri, ọgwụ nakwa ihe ndị ọzọ ha chọrọ.

Maurine Mangha gbara afọ 21, kwuru na ya na mmadụ ise ndị ezinaụlọ ya gbara ọsọ n'Akwaya dịka agha ahụ malitere ịgba ndị na-eme mmemme ncheta ụbọchị nwereonwe ha n'ụbọchị mbụ nke Ọktoba 2017, egbe.

"Ha gbara ọtụtụ mmadụ egbe, ọ bụ ya mere anyị ji gbabanye n'ime ọhịa", ka ọ gwara BBC.

Ụmụakwụkwọ abụọ yi uwe ojii maroon, uwe elu pink na Crocs na-acha edo edo na-agafe ụgbọala ndịagha
Nkọwa foto, Esemokwu ahụ emebiwo agụmakwụkwọ nke ukwuu na mpaghara ndịda ọdịda anyanwụ Cameroon (foto e chekwara)

Maurine kwụsịrị ịga akwụkwọ maka na ndị ojiegbe ahụ yiri egwu ịmachi ụlọakwụkwọ.

Ha malitere ịwakpo ụlọakwụkwọ, nke a bụ ihe metụtara ọtụtụ ụmụakwụkwọ.

Ihe ruru ụmụaka 200,000 akwụsịla ịga akwụkwọ na mpaghara agha na-ada ebe ogige ọmụmụ 2,500 dị na mpaghara ahụ ka na-arụ ọrụ dịka ụlọọrụ UN na-ahụ maka ụmụaka si kwuo.

N'agbanyeghị nke a, Maurine jisiri ike nweta ohere ịgụ akwụkwọ n'efu site n'enyemaka ụlọọrụ UNHCR. Ugbua, ọ na-agụ 'Microbiology' n'ụlọakwụkwọ polytechnic.

Maurine kwuru na ọ na-eche maka ndị enyi ya na-enweghịike ịhapụ mba Cameroon.

Onyonyoo gosiri nwaagbọghọ na-ele anya igwe e ji ese foto. O guzoro ọtọ n'akụkọ ime ụlọ a na-alụ alu.
Nkọwa foto, Maurine Mangha gbara mbọ inweta ohere ịgụ akwụkwọ n'efu ma gaa n'ihu n'agụmaakwụkwọ ya

Dịka agha ruru ihe dịka afọ iri, gọọmenti mba Cameroon chọrọ ka ndị ojiegbe a kwụsị agha a.

Na Septemba, ha malitere nrụrịtaụka iji chọpụta ụzọ a ga-esi nweta udo.

Praịm mịnịsta bụ Joseph Dion Ngute kwuru na ọ bụ ọrụ dịịrị ọha nakwa gọọmenti ịkpọ ndị ojiegbe a ma gwa ha ka ha kwụsị agha a.

O kwukwara ihe na Bamenda dị na mpaghara ugwu ma bụrụkwa ebe agha kachasị metụta.

N'ọgbakọ abụọ a o kwuru okwu, ndị ojiegbe wụsara egbe ha ruru 60 bịara ma nyefee onwe ha n'aka gọọmenti.

Onyeisiala Biya gbara afọọnụ ma yiri uwe ọcha na uwe ojii dịka ọ na-ele anya n'ebe tere aka.
Nkọwa foto, Onyeisiala Paul Biya anọọla n'ọchịchị kemgbe1982, ma bụrụ onye a katọrọ ọchịchị ọtụtụ ugboro

N'agbanyeghị mbọ a na-agba ime ka ndị ojiegbe a wụsa egbe ha, ọtụtụ n'ime ha ka na-aga n'ihu eme mwakpo dị iche iche.

Ndị maara ihe ekwe na-akụ kwuru na ihe mere agha ji nọọ ọtụtụ oge bụ maka na gọọmenti emeghị ihe ha kwesịrị ime iji gbochie ya.

Roland Fru, bụ onye na-eme nnyocha agha Anglophone crisis, kwuru na gọọmenti egosibeghị na ha ghọtara ihe na-akpali agha a.

"Anụbeghị ka gọọmenti kọwara n'ụzọ ọbụla na ha ghọtara maọbụ mee ka m ghọta na ha maara ihe bụ nsogbu na-akpata agha a," ka o kwuru.

BBC kpọtụụrụ ọtụtụ ụlọọrụ gọọmenti mana ha azaghachighị ozi anyị.

Gọọmenti Cameroon akatọọla ụta a na-ata ha banyere etu ha si ghara ilebanye anya n'agha.

N'ọnwa Nọvemba 2025, Onyeisiala Paul Biya kwuru na gọọmenti na-agba mbọ site n'enyemaka mba ofesi ndị ọzọ, inweta udo na mpaghara agha a metụtara.

Median, Glory na Maurine, udo bụ otu ihe ha na-atụ anya ya dịka ha nwere olileanya na agha ga-ebe. Dịka ha na-atụanya udo ịlaghachita, Median onye ka bi na Cameroon, kwuru na obi dị ya aṅụrị ịdị ndụ taa.