Kedụ oge ị ga-amalite ịchọrọ onye na-enwe nsogbu ahụike uche enyemaka?

Otu nwoke nọdụrụ ala, kpuo ihu ya n'ala, tinye aka n'isi ya ma na-eche echichie

Ebe foto si, Getty Image

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ndị ọkachamara na-ahụ maka ahụike uche ekwuola na ọtụtụ ndị mmadụ na-enwe nsogbu ahụike uche na-egosi ihe mgbaama tupu ọnọdụ ha akawanye njọ, mana ọtụtụ ezinụlọ anaghị achọpụta ọnọdụ a n'oge.

Nke a na-eme dịka ọtụtụ mmadụ na-enwe ọrịa uche ugbua anaghị enweta enyemaka n'oge kwesịrị ekwesị, nke nwereike ime ka ọnọdụ ha kawanye njọ.

Otu onye mara ihe ekwe na-akụ, gwara BBC News Igbo na mgbanwe ndị mmadụ na-ahụ n'omume na echiche onye ha hụrụ n'anya ekwesịghị ịbụ ihe a ga-eleghara anya.

Donatus Okafor bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka akparamagwa mmadụ bụ God's Hand Rehabilitation Center dị na Nibo n'Anambara steeti kwuru na ọ bụ oge mmadụ malitere igosi mgbanwe n'omume maọbụ echiche nke na-egosipụta ọtụtụ izu ma na-emetụta ndụ onye ahụ kwa ụbọchị, bụ oge ezinụlọ ya kwesịrị ịchọ enyemaka n'aka ndị ọkachamara.

Ọ gara n'ihu kwuo na otu n'ime ihe na-eme ka ọtụtụ ndị ọrịa ghara ịgbake ngwangwa bụ na ọtụtụ ezinụlọ na-eche ruo mgbe ọnọdụ ahụ mebiri tupu ha eburu onye ahụ gawa ụlọọgwụ maọbụ ịhụ onye ọkachamara na-ahụ maka ahụike uche.

"Dịka ọrịa ndị ọzọ, nsogbu ahụike uche na-achọ ka a chọpụta ya maọbụ malite ọgwụgwọ ya n'oge. Mgbe a na-egbu oge, o nwereike ime ka ọgwụgwọ wee ogologo oge maọbụ sie ike," ka o kwuru.

Ihe mgbama na-egosi na ọnọdụ mmadụ chọrọ enyemaka

Okafor kwuru na ezinụlọ kwesịrị ịkpọtụrụ dọkịta ma ọ bụrụ na onye ha hụrụ n'anya bido igosi ụfọdụ n'ime omume ndị a:

*Igosi mwute maọbụ enweghị olileanya ruo ọtụtụ izu.

*Ịkwụsị ikwurịta okwu maọbụ mmekọrịta ya na ndị ọzọ.

*Iwe iwe dị ukwuu maọbụ ime ihe ike n'enweghị ihe doro anya kpatara ya.

*Ikwu okwu na-enweghị isi, maọbụ ikwu na ọ na-ahụ maọbụ na-anụ ihe ndị mmadụ ọzọ na-adịghị ahụ maọbụ anụ.

*Ịleghara ịdị ọcha onwe ya anya, dịka ịsa ahụ na ịsacha ọnụ, maọbụ jụ ihi ụra na iri nri.

*Iṅu oke mmanya maọbụ iji ọgwụike eme ihe.

*Ikwu okwu na-egosi na ndụ adịzighị ya mkpa maọbụ na ọ ga-akara ya mma ma ọ nwụrụ anwụ.

Mana mgbaama ndị a a pụtara na onye ahụ nwere ọrịa uche?

Ọ kọwara na mgbaama ndị a apụtaghị mgbe niile na onye ahụ nwere ọrịa uche, mana ha bụ ihe ịrịbaama na onye ahụ kwesịrị ka ndị ọkachamara nyochaa ya maọbụ nyere onye ahụ aka.

Lee ihe ezinụlọ kwesịrị ime

Okafor dụrụ ezinụlọ ọdụ ka ha ghara ịkpọ onye nwere ọnọdụ a onyeara, ịkatọ maọbụ ikwu na nsogbu onye ahụ bụ naanị nke mmụọ n'enweghị ihe ndị ọkamara ahụike ga-eme maka ya.

"Ihe kacha mkpa bụ ịge onye ahụ ntị, igosi ya ịhụnanya na nkwado, ma nyere ya aka irute ụlọọgwụ maọbụ hụ onye ọkachamara ahụike uche. Nke a nwereike ime nnukwu mgbanwe n'otu onye ahụ ga-esi gbakee," ka o kwuru.

Okafor gara n'ihu kwuo na ịchọ enyemaka n'oge na-eme ka ohere onye ahụ ịgbake dịkwuo elu, na-enyekwa ọtụtụ ndị ọrịa ohere ịlaghachi n'ọrụ ha nakwa ndụ ha ngwangwa.