Gịnị ka ọchịchị ndịagha mba Mali ga-eme dịka ndịagha nnupuisi wakporo ha?

Ebe foto si, AFP via Getty Images
- Onye dere ya, Makuochi Okafor
- Ndị mere akụkọ a, BBC Africa
- Onye dere ya, Mohamed Ibrahim
- Ndị mere akụkọ a, BBC Arabic
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5
Mwakpo ndịagha nnupuisi mere na Bamako bụ isiobodo mba Mali ma gbuo minista nchekwa ha ma nwere ọnọdụ na mpaghara ugwu Mali, bụ ihe mgbagwojuanya nye ọtụtụ mba dị na ndịda anyanwụ.
Ndị obodo dị iche iche na Mali malitere ịnụ ụda egbe dịka ha tetara n'ụra n'ụtụtụ Satọde - nke sitere na mwakpo otu ndịagha nnupuisi Azawad Liberation Front (FLA) na otu JNIM nke al-Qaeda na-akwado kwuru na ọ bụ ha mere.
Mwakpo ahụ nakwa mwepụ e wepụrụ ndịagha Mali na Rọshịa n;obodo Kidal dị na mpaghara ugwu Mali, emeela ka ọtụtụ mmadụ malite ịjụ ajụjụ banyere ikike gọọmenti Kọlnel Assimi Goïta, onye batara n'ọchịchị oge ọ napụrụ ọchịchị n'ike n'afọ 2020.
O weela Goïta ọtụtụ ụbọchị kemgbe mwakpo ahụ iji pụta kwuo okwu, nke mere ka a malite ịjụ ajụjụ banyere ọdịnihu ọchịchị ndịagha junta mba Mali nakwa uru ndịagha mba Rọshịa e zigara na Mali nakwa mba ndị ọzọ gbara ya gburugburu igbochi ajọ ọnọdụ nchekwa na mba ndị a.
Kedụ ihe a na-atụanya nwereike ime?
Nke mbụ: Ọchịchị ndịagha ga-anọ n'ọchịchị ma megwara
Ọtụtụ ndị maara ihe ekwe na-akụ na-ekwu na atụmatụ a bụ nke nwereike ịba uru maka na ndịagha ka ji ọnọdụ n'ọtụtụ obodo dị mkpa nakwa n'ụlọọrụ gọọmenti.
Mana ha kwuru na ụbọchị na-abịa n'ọdịnihu dị oke mkpa dịka ndịagha na-akwado ịwakpo otu JNIM na FLA.
Beverly Ochieng si ụlọọrụ Control Risks, kwuru na ọ bụrụ na nke a mịta mkpụrụ, ọ gaa-abụ ihe ga-abara ọchịchị ndịagha ahụ uru.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ka abalị atọ gasịrị e mere mwakpo ahụ, Kọlnel Goïta ziri ndị mba Mali ozi na mgbasaozi onyonyoo ma kwuo na ọchịchị ya na-agba mbọ iweta udo ma nwụchie ndị mere mwakpo ahụ.
Foto e wepụtara n'akara soshal midia Onyeisiala, gosiri ka Kolnel Goïta na onye nnọchiteanya mba Rọshịa na Mali bụ Igor Gromyko na-enwe mkparịtaụka nke gosiri na gọọmenti mba Mali nwere ntụkwasiobi na mmekọ ha na mba Rọshịa.
O gosikwara foto onyeisi ndị ahụ chọrọ iwere ọchịchị n'ike oge ọ gara ileta ndị merụrụ ahụ na mwakpo ahụ n'ụlọọgwụ.
E kwuru na ọnwụ minista nchekwa bụ Sadio Camara bụ ihe nwereike ichere ndịagha aka mgba dịka ha na-akwado imegwara mwakpo ahụ.
Onyeisi ụlọọrụ Konrad Adenauer Foundation bụ Ulf Laessing, kwuru na ọnwụ Camara nwekwara ike imetụta mmekọ mba Mali na mba Rọshịa.
Camara bụ otu onye isi kara aka n'ọchịchị ndịagha junta mba Mali ma bụrụ onye hụrụ maka mmekọ ha na Rọshịa nakwa onye hụrụ maka nziga e zigara ndịagha Rọshịa na mpaghara Sahel.

Ebe foto si, @PresidenceMali
Ọ bụ ezie na ndịagha Mali na-ekwu na ha na-alụ ọgụ iji chekwa akụkụ ndị oke mkpa na mba ahụ, ọ ga-enwe nsogbu dịka otu FLA gosipụtara ọchịchọ ha ịkwaga na ndịda site na Kidal.
"Anyị chọrọ ijikwa obodo Gao. Ọnụụzọ Gao niile adaala, mana ogige ndịagha adabeghị," ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Mohamed Elmaouloud Ramadane kwuru.
Ọ gwara BBC na obodo Timbuktu nọkwa n'uche ha: "Ọ ga-adị mfe iweghara ya ozugbo anyị jikwara Gao na Kidal nke ọma."
Ndị ọchịchị nwere nkwado oge ha weghaara ọchịchị ihe fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ afọ isii gara aga, ma na-ekwe nkwa na ha ga-egbochi nsogbu nchekwa na-echere mba Mali aka mgba.
Nke abụọ: Ndị ọchịchị nwere nkwado Rọshịa ma na-achọkwa nkwado ndị ọzọ
Ochieng kwuru na mwakpo izuụka gara aga, metọrọ etu e si ahụta mba Rọshịa dịka ndị ọkaibe n'ihe gbasara nchekwa na mba Mali.
Dịka ha nwere ọchịchị n'ike n'afọ isii gara aga, a gwara ndịagha mba Fransị na-akwado ndịagha Mali ka ha pụọ dịka a kpọbatara ndịagha mba Rọshịa ka ha bịa buo agha megide ndị na-eyi ọha egwu ahụ.
Laessing kwuru na etu e si ahụta ndịagha mba Rọshịa agbanweela maka na mbọ ha gbara ichekwa mba Mali nakwa ọdịda obodo Kidal kpụrụ afọ n'ala.

Ebe foto si, Reuters
N'agbanyeghị nkwado mba Rọshịa, Mali nwereike ịmalite ịchọ nkwado ndị mba ọzọ.
Otu n'ime nkwado ọhụrụ ndị gụnyere nkwado mba Tọki bụ ndị na-achọ ịgbasa owuwu ha n'Afrịka.
Ochieng kwuru na e nwere akụkọ na e zigala ndịagha mba Tọki ka ha nye ndị ochekwa obi ọchịchị mba Mali ọzụzụ.
Tọki na mba Mali nwere mmekọ n'ihe gbasara nchekwa, ha na-enye ha droonu nke ha ji weghara Kidal n'aka ndịagha nnupuisi n'afọ 2024.
Mali na-ekwu na ha chọrọ iwulite mmekọ ha na mba Amerịka nke kpụrụ afọ n'ala kemgbe.
Onyeisi na-ahụ maka ihe gbasara Afrịka n'ụlọọrụ State Department, mere njem na Bamako iji gosi nkwanye ugwu mba Amerịka nwere nye nwereonwe mba Mali ma chepụta usoro ọhụrụ iji megharịa nkwado dị n'etiti ha abụọ.
O kwuru na Amerịka chọrọ ka ha na mba Niger na Bọkịna Faso bụ mba agbataobi Mali rụkọọ ọrụ n'ihe gbasara nchekwa.
Bamako kwuru na ha ga-agbado ụkwụ n'otu Alliance of Sahel States (AES), bụ otu jikọtara Mali, Bọkịna Faso na Niger - bụ mba atọ ndịagha ji ọchịchị.
Bọkịna Faso na Niger kwuru na ha na-akwado Mali mana ha emebeghị ihe ọbụla banyere nchekwa.
Ihe nke atọ: Ịchụpụ ọchịchị ndịagha - mana kedụ onye ga-enwere ọchịchị?
Mwakpo ahụ mere n'ụbọchị Satọde, bụ ihe aka mgba nye ọchịchị ndịagha kemgbe ọtụtụ afọ.
Mwakpo ọzọ nwereike ime ka ndị obodo kwụsị inwe ntụkwasịobi n'ọchịchị ndịagha.
Ihe nwereike ime bụ otu ndịagha ọzọ ịnapụ ọchịchị n'ike.
N'aka nke ọzọ, mmekọ FLA-JNIM, nwereike ịnọchi gọọmenti ji ọchịchị ugbua mana nke a agaghị adị mfe nye ha.
Otu FLA na-egosi onwe ya dịka otu ndọrọndọrọ ọchịchị ebe JNIM bụ otu ndịagha nnupuisi alakụba.
Ndịagha nnupuisi mba Mali enweghị ezi mmekọ kemgbe afọ 2012 oge ndịagha nnupuisi alakụba mabuuru Tuareg.
Onye na-ekwuru otu FLA kọwara ndịagha JNIM nwanne ha ma kwuo ha na-ebuzu otu onye agha ma kwuo na ha kwesịrị ịnọkọ ọnụ.
Mana onyendu FLA bụ Sayed Bin Bella gwara BBC na-enweghị mmekọ dị n'etiti ha.
"Ọkọlọtọ niile anyị wepụtara bụ nke anyị, ọ bụghị nke ndị al-Qaeda. Ọ bụrụ na ha chọọ ka anyị na ha nwee mmekọ, ha ga-akwụsị mmekọ ha na al-Qaeda ka o kwuru.
Ndị maara ihe ekwe na-akụ kwuru na njke nwereike ibute nsogbu ọchịchị n'ọdịnihu.






























