Chimamda Ngozi Adichie: Ụlọikpe akagbuo mkpesa ụlọọgwụ mere ka a kwụsị ime nnyocha banyere ọnwụ nwa ya

Chimamanda Ngozi Adichie bụ onye odeakwụkwọ a ma ama n'ụwa.
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụlọikpe UKwu dị na Legọs nọọrọ n'ụbọchị Mọnde 12 Ọktoba 2026 kagbuo akwụkwọ mkpesa ụlọọgwụ Euracare Multi-Specialist gbara nke sị ka a kwụsị nnyocha a na-eme maka ọnwụ Nkanu Esege bụ nwa Chimamanda Ngozi Adichie nwụrụ n'ụlọọgwụ ahu mgbe ọ dị naanị ọnwa iri abụọ na otu.

Ọkaikpe Aishat Opesanwo mgbe ọ na-akagbu mkpesa ahụ ma kwuru na ụlọọgwụ gbara akwụkwọ na-aghọtaghị ọdịdị, ikike nakwa etu ụlọikpe nnyocha a kpọrọ 'coroner court' si arụ ọrụ.

Ọkaikpe Opesanwo rụtụrụ aka n'ọtụtụ nchọpụta dị mkpa. O kwuru na iwu ngalaba iwu na-achịkwa Lagos State Coroner's system nke afọ 2007 kwuru na ọ dị mkpa ma bụrụ iwu ka e mee nnyocha banyere onye ọbụla nwụrụ n'ụlọọgwụ.

Ọ kụchapụrụ mkpesa ụlọọgwụ nke kwuru na ndọkwa ozu nwata nakwa ahụghị ozu ya anya ga-eme ka ụlọikpe nnyocha a ghara inwe ikike ileba ozu ahụ anya.

N'ịga n'ihu Ọkaikpe Opesanwo kwuru na ụlọikpe nnyocha 'coroner' bụ ime nnyocha iji chọpụta eziokwu banyere onye, etu, mgbe nakwa ebe mmadụ nwụrụ karịa ikpe mmadụ ikpe maọbụ nye ụta banyere ọnwụ mmadụ.

Cheta na nwa Chimamanda bụ Nkanu Esege nwụrụ n'ụbọchị asaa nke ọnwa Jenụwarị afọ 2026 n'ụlọọgwụ Euracare Multi-Specialist Hospital dị na Lagos.

Nke a mere ka Chimamanda na di ya bụ Ivara Esege boo ụlọọgwụ ahụ ebubo maka ileghara ahụike nwa ha anya, ma sị na a gbafere ya ọgwụ ụra oke tinyekwara enyeghi ya ịgwe e ji eku ume ọfụma nke butere ọrịa obi a kpọrọ 'cardiac arrest'.

Mana ụlọọgwụ ahụ kwuru na e butere nwata ahụ n'ụlọọgwụ n'ọnọdụ dị njọ ma natakwa ọgwụgwọ n'ezi usoro ọrụ ahụike.

Site n'iwu gọọmenti Lagos State nyere sị ka e mee nnyocha banyere etu nwata ahụ si nwụọ, ụlọọgwụ Euracare gara mee mkpesa n'ụlọikpe ukwu sị ka a kwụsị nnyocha ahụ.

Ụlọọgwụ a kwuru na ime nnyocha ma ọ bụrụ na ozu nwata ahụ adịghị nso ga-eme ka nnyocha ahụ ghara izu oke maọbụ e nwee akụkọ ọzọ banyere ya ma bụrụkwa igbu oge na imefu akụnaụba.

Ha rụkwara ụka sị na ịgwa onye ọrụ ahụike ka o gosi ihe akaebe bụ ihe megidere ikike dịịrị ụlọọgwụ ahụ dịka iwu ngalaba 38 nke afọ 1999 si kwuo.

Mana ụlọikpe kụchapụrụ mkpesa ahụ ụlọọgwụ a nyere.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị