Pope Francis: E zuteere m ekwesu ugboro atọ ma hụkwaa ọkụ ala mmụọ

Ebe foto si, Getty Images
Akwụkwọ ndekọ e wepụtara n'ụbọchị Tuzde 24 Nọvemba 2026, ekwuola na Pope Francis nwere nsogbu nke ime mmụọ oge ọ bụ onyeisi ụka Katọlik n'ụwa bụ mgbe o zutere ekwensu na ọkụ ala mmụọ n'ọhụhụ, dịka ọ na-agba lịkalịka etu ọ ga-esi chịkwaa ikike.
Akwụkwọ ndekọ a e bipụtara, bụ nke Pope Francis dere oge ọ ji ọkwa ahụ.
Ozi kwuru na Pope Francis si mba Argentina, nwere akwụkwọ ndekọ o ji ede ihe niile ọ na-eme malite n'afọ 1992 oge e chiri ya Bishop na mba Argentina ruo 2024.
Ụfọdụ ihe ndị ahụ Pope Francis dere n'akwụkwọ ndekọ ahụ abụrụla nke e tinyere n'akwụkwọ ọhụrụ Cardinal Víctor Manuel Fernández bụ onye ya na Pope Francis nwere mmekọ depụtara n'ụbọchụ Tuzde.
Cardinal Víctor Manuel Fernández bụkwa onye mba Argentina dịka Pope Francis.
Akwụkwọ ahụ dị mpekere 160 a kpọrọ "The Private Diary of Pope Francis", bụ nke nwere ụfọdụ ihe dị iche iche na njem Pope Francis dịka onye ụkọchukwu n'agbanyeghị na ọ kọwara etu o si nwee nsogbu nakwa ọwụwa nke metụtara inweta ike site na 2021 ruo 2022.
Akwụkwọ ahụ kọwara etu Pope Francis si zute ekwensu nakwa echiche banyere onye nọchiri ya bụ Pope Leo onye ọ kọwara dịka onye na-enweghị 'ntụpọ'.
Mbipụta akwụkwọ ndekọ Pope ọbụla abụghị ihe a na-emekarị n'ihi na ọ na-ewepụta ọtụtụ ihe zoro ezo banyere ndụ ha dịka Pope.
Ụfọdụ Pope na-ekwu ka a gbaa akwụkwọ ndekọ ha ọkụ mana e bipụtara nke John XXIII dịka ọ nwụrụ nakwa ụfọdụ mpekere akwụkwọ nke John Paul II.
Pope Francis dere mpekere 86 akwụkwọ ojii ahụ n'afọ 1992 oge ọ nọ na mba Argentina ma dee mpekere 55 oge e chiri ya Pope.
Ihe ụfọdụ dị n'akwụkwọ ndekọ ahụ
Akwụkwọ ndekọ ahụ kwuru na ajọ mmụọ wakporo Pope Francis ọtụtụ ugboro. Pope Francis dere maka ugboro atọ o mere. Abụọ mere oge ọ bụ Archibishop mpaghara Buenos Aires nakwa ọzọ mere oge ọ bụ Pope n'afọ 2018.
Pope Francis kwuru na ekwenzu nwere anya na-ewu ọkụ ma kọwaa anya ya dịka nke dị njọ ma na-awale mmadụ.
"Enweghị m ike ichefu anya ugboro abụọ m hụrụ ya dịka m nọ n'ụgbọala alaghachi ụlọ m nakwa n'ogige ndị na-ekwe ukwe n'ụlọụka. Mana ọ na-agbanwe oge niile bụ ihe Pope Francis dere na Ọgọst 18 2024.
Nke ugboro atọ m hụrụ ya bụ oge m si njem mba Chile alaghchita na 2018. O kwuru na njem ahụ bụ nke gbaoro ụkwụ n'okwu ndị ụkọchukwu na-akwa iko ma na-emetọ ahụ.
"N'otu oge, dịka m laghachitara Rome, ahụrụ m ya dịka m nọ n'ọgbakọ ma nụ olu ya dịka o kwuru "Enwetala m ihe niile m chọrọ", bụ ihe Pope Francis dere na Jenụwarị 24 2021.
Agaghị echezọ anya ya nakwa etu olu ya dị. Chukwu nyeere m ohere ịhapụ ọgbakọ ahụ ma mee ka ọ tọhapụ m?".
Nkụzi ụka katọlik kọwara ekwensu dịka mmụọozi dara mba ma dọọ aka na ntị na ndị ụka katọlik chọrọ ịdị nsọ nwereike inwe mwale nakwa mwakpo ime mmụọ.
Oge o ji ọkwa dịka Pope, Pope Francis kwuru maka ekwensu ma kọwaa ya dịka onye ya na asịrị na ego na-adị na mma.
Akwụkwọ ahụ kwukwara etu Pope Francis si kwuo na Chukwu gwara ya okwu na nrọ.
O kwuru na ọ hụrụ ọnụụzọ ọkụ mmụọ. N'afọ 2018, Pope Francis kọwara ya dịka ajọ mmụọ na-achọ ịwa mmadụ ọwụwa nke o kwuru na ọ bụ site n'ikpere chi ọzọ.
O kwuru na oke egwu tụrụ ya dịka o lebanyere anya n'ime ọkụ mmụọ ahụ. O kọwara na ọ bụ tupu ọ ma;ite ihi ụra ka nke a mere.
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ gara n'ihu jiri rosary ya dịka ngwa agha ma kelee Chukwu maka inyere ya aka ma zọpụta ya.


























