A chọpụtala ozu ụmụaka atọ n’ụlọ otu nwaanyị dibịa n'Anambra steeti
Ihe mgbawa obi emela n’Anambra dịka a hụrụ ozu ụmụaka atọ na be Ezenwaanyị n’obodo Ideani dị n’Idemmili Nọt dị n'Anambra steeti.
Ndị Uweojii Anambra steeti kwuru na ha ji obi mgbawa na-agwa ọhaneze na ha chọpụtara ozu ụmụaka atọ n’otu ụlọ nwaanyị dị n’Umuoduba village, Ideani di na okpuruọchịchị Idemmili Anambra steeti.
Ozi ahụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra bụ Tochukwu Ikenga dere, kọwara n’ụbọchị Wenezde abalị ise nke ọnwa Ọgọst ka ndị uweojii nke Ogidi Police station nwetara ozi na ozu ụmụaka anọ tọgbọrọ na be otu Ezenwaanyị.
E kwuru na ha amaghị nwaanyị ahụ abụ onye na-agwọ ọgwụ ka ọ bụ onye ekpere adịgboroja.
Ozugbo ndị uweojii nwetara mkpesa ahụ, ka ha gbara ọsọ rute be nwaanyị ahụ, wee hụ ụmụaka anọ nọ n'agbata afọ iri ruo iri na ise ka ha nọzị n’ọnụ ọnwụ.
Ha buuru ha gbaga n’ụlọọgwụ ebe dokịta nọrọ kwuo na ụmụaka atọ anwụọlarii ebe otu nwata ka nọ ọnọdụ ọnwụ na ndụ ugbua n’ụlọọgwu.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Ndị uweojii Anambra kwuru na ha ejidela nwaanyị ahụ a na-enyo enyo n'aka ya dị n’ọnwụ ụmụaka ahụ.
Ha yọrọ ndị Ideani ka ha dere juu hapụ ime ọgbaaghara n’ihi na ha bụ ndị uweojii ga-achọpụta ihe mere ụmụaka ahụ.
Ha kwuru na olileanya ha bụ na nwatakịrị nke dị ndụ ga-enweta onwe ya ma kwuo ihe mere ha.
A tinyela ozu ụmụaka atọ ahụ na ọdọ ozu bụ “mortuary” wee na-akwado imalite nnyocha ịchọpụta ka mmadụ siri nwụọ bekee kpọrọ “Autopsy”.



