Ebonyi state news: Oke mmiri eburula ụlọ ma merụọ ndị mmadụ ahụ n'Ebonyi

Mgbe e biputara ya
Onye ndu obodo Nwezenyi nke dị n'Igbeagu nke Ebonyi steeti bụ Pius Ola si na oke mmiri zoro mebiri ụlọ 12 ma merụrụ ndị mmadu ahụ.
Ọ bụ n'ụbọchị Tọọzde bu ụbọchị asatọ nke ọnwa Eprelụ ka mkpa mkpa a kpara.
Maazị Ola na-arịọ ka gọọmentị gbatara ha ọsọ enyemaka.
Otu onye ọzọ ihe a metụtara bụ Ukochukwu ụka Anglican na Nwezenyi bụ Ifechukwu Ezeuko, sị na ọ bụ ka ọ kụrụ elekere asaa nke abalị ka oke ikuku bịara buru elu ụlọụka.
Ọ sị na ọ bụ ụlọụka abụọ na ọtụtụ ụlọ n'obodo ahụ ka oke mmiri a mebiri.

Ukochukwu Ezeuko sị na ọtụtụ ezinaụlọ gụnyere ụmụaka na ụmụnwaanyị merụrụ ahụ ma na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ.
Odoziakụ Angela Owu, Igbenyi Francis, Veronica Agbo na ndi ọzọ kọkwara etu ọdachị a si metụta ezinaụlọ ha.
































