Olu Jacobs bụ ezigbo nna m ukwu n'ihe gbasara ime ejije - Kanayo O Kanayo
Omee ejije a ma ama bụ Kanayo O Kanayo akọwaala Olu Jacobs dịka onye maara nke o riri ihe gbasara ime ejije.
Kanayo sịrị: "Ọ na-erubeisi n'oge e nyere ya ịbịa ebe a na-eme ejije. Ị gaghị agwa Olu Jacobs na oge o kwesịrị iji bịa bụ elekere itoolu, ka ọ ghara ịbịaru mgbe o jiri ọkara gaa elekere asatọ".
"Chukwu zọwa gị ma ọ bụrụ na gị na Olu Jacobs mekọọ ejije ma ị gosipụtaghị onwe gị dịka onye maara ọrụ ya. Ọ ga-eji ụzọ dị mfe gwa etu o siri gbasie mbọ ike na ngaalaba ejije mba Briten nakwa etu ị ga-esi dịkwuo mma."
Maazị Kanayo kọwara Olu Jacobs dịka ngọzi nyere ya, ma kwuo na ọ na-enye ya nnukwu ọṅụ oge ọbụla ya na Olu Jacobs mekọrọ ejije.
"Onye a dịka obere chi, ọ na-ara ya ahụ ichefu ahịrịokwu ya, ma emume ọbụla na-eji nkọwa nke ya abịa," ka Kanayo kwuru.
Olu Jacobs: Ihe ụfọdụ i kwesịrị ịma gbasara ndụ onye ihe jije a lara mmụọ
- A mụrụ Oludotun Baiyewun Jacobs n'ụbọchị 11 Julaị 1942.
- Ọ natara ọzụzụ na Royal Academy of Dramatic Art tupu ọ malite njem ya si n'ụlọmgbasaozi mba Briten bụ British Television ruo n'ọtụtụ ejije a ma ama na mbaụwa.
- O sonyere n'ejije karịrị otu narị (100) ma natakwa ọtụtụ nkwanyeugwu, nke gụnyere ọkibe n'ime ejije n'afọ 2007 bụ nke African Movie Academy Award nyere ya.
- E nyekwara ya ihe nrite Member of the Order of the Federal Republic n'afọ 2011.
- Ya na nwunye ya bụ Joke Silva jikọtara aka hiwe Lufodo Group na Lufodo Academy of Performing Arts.
- N'ime afọ ole na ole ndị gara aga ka ọ malitere ịrịa ọrịa nchefu bụ 'lewy body dementia', bụ nke mere ka ọ kwụsị ime ejije.
- E bugharịala ozi ụgha gbasara ọnwụ ya ugboro ugboro, ke gụnyere n'afọ 2021 na 2024, mana ezinaụlọ ya pụtara kwuo na ọ bụghị eziokwu.
- Ndị dị ndụ na-eru uju ọnwụ ya gụnyere nwunye ya bụ Joke Silva, ụmụ ya, ụmụ ụmụ ya nakwa ọhanaeze ndị ihe ya na-amasị.

Ebe foto si, @mrjacobs
Olu Jacobs anwụọla

Ebe foto si, Olu Jacobs/Instagram
Omee ejije a ma ama na Naịjirịa bụ Maazị Oludotun Baiyewu a maara nke ọma dịka Olu Jacobs anwụọla dị ka ọ gbachara afọ iri asatọ na anọ (84).
Nke a dị n'ozi nwa ya nwoke wepụtara n'akara Instagram ya n'ụtụtụ Wenezde 16 Septemba 2026.
Ọ nwụrụ ka ọ rịachara ọrịa ụbụrụ a kpọrọ Dementia ogologo oge.
Nwoke a bụ nwaafọ Egba Alake dị n'Abeokuta n'Ogun Steeti mere ọtụtụ ejije oge ọ dị ndụ.
Akụkọ na-abịa...
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post




























