Anambra kwesịrị ịkwado gọọmenti etiti – Ka Soludo kwuru dịka ọ gara n'ihu ịpịasu Peter Obi

Ebe foto si, Chukwuma Soludo/X
Gọvanọ Anambra Steeti bụ Chukwuma Soludo akpọọla oku ka ndị Igbo kwado gọọmenti etiti iji keta oke niile ruuru ha na ndọrọndọrọ ọchịchị.
Ọ gwara ndị Igbo ka ha ghara ikwe ka obi ebere ha kpebiere ha onye ha ga-atụnyere vootu na ntuliaka na-abịa abịa.
Soludo nyere ndụmọdụ a oge ọ gara njem achụmtavootu n'okpuru ọchịchị ime obodo Ekwusigo dị n'Anambra Steeti.
"Lee mbụze na-eme n'okpuru ọchịchị Ekwusigo. Kemgbe onye a malitere igwu ndọrọndọrọ ọchịchị, kedụ ihe o merela gbasara ya"?
"Oge ntuliaka ruo, ị bịa kọọrọ anyị akụkọ, anyị a ka nọrọkwa ebe anyị nọ," ka gọvanọ Anambra Steeti kwuru.
Soludo kọwara mkpa ọ dị ndị Anambra ịgbakọọrọ gọọmenti etiti aka iji nwee ike rite uru nke ọchịchị onye kwuo uche ya.
Dịka Gọvanọ Soludo siri kwuo, "ndị Igbo ga-eketa oke ha na nke ugbua. Anyị ga-eso jee ọgụ ahụ ka Igbo keta oke ha."
End of Akụkọ ndị ọzọ mere n'Anambra Steeti
Cheta na kemgbe abalị ole ma ole ugbua ka Gọvanọ Anambara steeti bụ Chukwuma Soludo na Peter Obi bụbu Gọvanọ steeti ahụ ma jiri otu ndọrọndọrọ ọchịchị Nigeria Democratic Congress (NDC) na-azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka afọ 2027 na-arụrịtaụka.
Nke a gbadoro ụkwụ na ọ bụ eziokwu na Peter Obi ji ndị mmadụ ụgwọ dịka Gọvanọ maọbụ na o jighị onye ọbụla ụgwọ mgbe ọ chịchara dịka gọvanọ Anambara steeti.
Etu ihe si dị, gọọmenti Anambara steeti na-ebo ebubo na Peter Obi ji ndị mmadụ ụgwọ mana Obi na-ekwu na ebubo ahụ abụghị eziokwu.























