Mock Election: Lee etu ị ga-esi sonye na nnwale ntuliaka INEC na-eme taa

Ebe foto si, Inec
Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka na Nigeria bụ 'Independent National Electoral Commission' (INEC), ga-eme nnwale teknụzụ nke ntuliaka afọ 2027 taa bụ Satọde, abalị iri abụọ na asatọ n'ọnwa Nọvemba 2026.
Nnwale a nke a maara dịka 'Mock Accreditation and Result Upload Exercise' n'asụsụ Bekee, bụ iji nwalee akụrụngwa Inec bụ 'BVAS' na usoro e si ezipụ mpụtara ntuliaka n'ịntanetị bụ (IReV), iji hụ na ha na-arụ ọrụ nke ọma tupu oge ntuliaka nke afo 2027 e ruo.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Kedụ etu ị ga-esi sonye?
A ga-eme nnwale ahụ site n'elekere asatọ na ọkara nke ụtụtụ ruo elekere abụọ na ọkara nke ehihie n'ụbọcị Satọde, n'ogige ịtụ vootu abụọ n'ime mpaghara ndebanye aha ndị ga-atụ vootu ruru 8,838 dị na Nigeria.
N'ime nnwale ahụ:
- A ga-eji igwe BVAS nwalee usoro ịmata ndị ga-atụ vootu na ntuliaka.
- Ndị sonyere ga-enweta akwụkwọ ịtụ vootu nwere aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị e mepụtara maka nnwale ahụ.
- A ga-anwale usoro izipu mpụtara ntuliaka site n'akụrụngwa BVAS.
Ụlọọrụ Inec kọwara na nnwale a abụghị ezigbo ntuliaka ebe a ga-ahọpụta ndị ọchịchị.
Kọmịshọna ụlọọrụ Inec na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Mohammed Kudu Haruna gwara BBC na, a gaghị eji ezigbo aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị mee nnwale ahụ.
O kwuru, sị: "Dịka aha ya si dị, nke a bụ nnwale, ọ bụghị ezigbo ntuliaka."
Haruna kọwara na kemgbe afọ 2023 ka Inec bidoro ime ụdị nnwale a n'oge ntuliaka dị iche iche, mana nke a bụ iji tụlee nkwado ha maka ntuliaka Onyeisiala.
Ọ gara n'ihu kọwaa na ebumnuche ya bụ ịchọpụta nsogbu teknụzụ na ihe ịma aka ndị nwere ike imetụta ntuliaka 2027, ka ụlọọrụ ahụ nwee ike idozi ha tupu ụbọchị ntuliaka e ruo.




























