Ihe i kwesịrị ịma maka nkwado gọọmentị etiti ga-enye ụmụafọ Nigeria 600 na-akwa akwa

Nwaanyị ji igwe e ji akwa akwa akwa akwa
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Gọọmenti Etiti Nigeria ekwuola na ọ ga-enye ndị na-akwa akwa ọnụ ọgụgụ ha ruru narị isii (600) ego nkwado ruru nde naira ise (N5m) n'otu n'otu iji nyere ha aka ịmalite azụmahịa nke ha ma kwalite ọrụ aka ha.

Gọọmenti kwuru na ha ga-eme nke a site n'atụmatụ 'Business Incubation for Renewed Hope Tailors nakwa nkwado ụlọọrụ Industrial Training Fund (ITF).

N'ime nde naira ise ahụ, nde naira abụọ na ọkara (N2.5m), bụ onyinye ego nke ndị ga-erite uru a agaghị akwụghachi. Nde naira abụọ na ọkara (N2.5m) nke ọzọ, bụ ego mgbazinye ha ga-etinye n'azụmahịa ha, nke ha ga-akwụghachi gọọmenti n'ime afọ ise.

Ebumnuche emume a bụ iji nyere ndị mụtara ọrụ ịkwa akwa aka ka ha nwee ike iji ya wulite azụmahịa ga-adịgide ma nwee ike inye ndị ọzọ ọrụ.

Mgbe ọ na-ekwu okwu n'ụbọchị Tọzdee 27 Nọvemba 2026 n'emume iji malite atụmatụ ahụ na Jos, Plateau steeti, onyeisi ngalaba iwu n'ụlọọrụ ITF bụ Safiya Abubakar, bụ onye nọchitereanya onyeisi ụlọọrụ ahụ bụ Afiz Oluwatoyin Ogun, kwuru na a haziri emume a ka o nyere ndị ga-erite uru na ya aka ma kwalite azụmahịa ha.

O kwuru na afọ ise ahụ ga-enye ha ohere ịmalite azụmahịa ha, mee ka ọrụ ha sie ike ma wulite ya ruo n'ọkwa ebe ọ ga-enweike ịga n'ihu.

Kedu ndi ga-erite uru na mmemme a?

Nwaagbọghọ na-akwa akwa

Emume a bụ maka ndị sonyere na emume ITF a kpọrọ 'Skill-Up Artisans Programme (SUPA)', nakwa ndị ọzọ na-akwa akwa na-esobughị na ya.

Mana onye chọrọ irite uru a ga-abụrịrị onye gafere ule asambodo ITF ma nweta ikike ụlọ ọrụ ahụ chọrọ.

Nke a pụtara na naanị ịmụta ịkwa akwa ezughị iji mee ka mmadụ ruo tozuo inweta nkwado a.

Kedu ka ndị a ga-erite uru a ga esi nweta nkwado?

Inye ha ego abụghị naanị ihe ITF ga-eme. Ndị a họpụtara ga-ahọrọ ebe ha chọrọ ịrụ ọrụ, ITF ga-enyocha ebe ndị ahụ tupu e jiri akara aha azụmahịa hazie ha ma tinye akụrụngwa ha ga-eji arụ ọrụ.

A ga-akụzikwara ha etu e si elekọta ego azụmahịa, chọta ndị ahịa ma na-elekọta ọrụ ha nke ọma.

Onye ọrụ na ngalaba nkụzi n'ụlọọru ITF bụ Tamara Bifmuk, kwuru na a ga-enyere ndị a aka n'ịrụzi nakwa ilekọta akụrụngwa ha site n'aka ndị ọkachamara, tinyere ohere ha ga-enwe ịmụtakwu ihe n'aka ndị nwere maara ihe ekwe na-akụ n'ọrụ ịkwa akwa.

Gịnị ga-eme ma ha akwụghachighị ego ahụ?

Ndị ga-erite uru a ga-akwụghachi nde naira abụọ na ọkara (N2.5m) ahụ n'ime afọ ise.

Dị ka Bifmuk si kwuo, ndị a ga-abụ ndị nwe azụmahịa ha kpamkpam mgbe ha kwụghachiri gọọmenti ego ahụ niile.

Mana onye akwụghachighi ego ahụ n'usoro ọnwa atọ n'usoro, a ga-anapụ ya azụmahịa e guzobere maka ya.

Mmadụ ole ka a ga-ahọpụta?

Gọọmenti chọrọ ka ụmụafọ Nigeria ruru 600 rite uru na emume a.

Iji mmalite ya, ahọpụtala ndị na-akwa akwa 150 si mpaghara ugwu North-Central.

ITF kwuru na emume a ga-enyere aka idozi ụfọdụ nsogbu ndị na-arụ ọrụ aka nwere, dịka enweghị ego ha ga-eji malite azụmahịa, enweghị akụrụngwa ọgbara ọhụrụ nakwa enweghị ezigbo nkụzi na ọzụzụ etu e si elekọta azụmahịa.

Emume a so n'atụmatụ 'Renewed Hope' nke gọọmenti etiti, nke gụnyere ịkwalite azụmahịa na imepụta ohere ọrụ maka ndị Nigeria niile.