SSPX: Ihe mere Vatican ji mapụ ndị Bishọpụ Katọlik anọ

Ebe foto si, EPA
Vatican ekwuola na ndị bishọp anọ e chiri ọhụrụ na-enweghị nkwado Pope Leo XIV, tinyere ndị bishọp abụọ sonyere n'emume ahụ, esozighị na Nzụkọ Katọlik.
Vatican kwuru na a mapụla ha n'ụka nke Bekee kpọrọ 'excommunication', n'ihi na ha mebiri iwu Nzụkọ Ụka Katọlik.
Ndị a achụpụrụ bụ ndị otu Society of Saint Pius X (SSPX), otu Katọlik na-agbaso omenala ochie nke jụrụ ndụmọdụ Pope Leo ka ha kwụsị ịchị bishọp ọhụrụ n'enweghị ikike Vatican. Ha gara n'ihu mee emume ahụ na Wenezde.
SSPX bụ otu Archbishop Marcel Lefebvre hibere na mba Switzerland n'afọ 1970.
Otu SSPX anabataghị ụfọdụ mgbanwe 'Second Vatican Council' wetara n'afọ ndị 1960, dịka iji asụsụ obodo eme Mass kama ha kwechiri na iji Latin.
Ọzọkwa, ha ekweghị na mmekọrịta Katọlik na ụka ndị ọzọ.

Ebe foto si, Getty Images
N'ozi Vatican wepụtara na Tọzdee, ọ dọrọ ndị ụkọchukwu na ndị otu Katọlik aka na ntị ka ha ghara isonyere otu ahụ, ma kwuokwa na alụmdi na nwunye na nkwupụta mmehie (confession) ndị otu ahụ ga-eme agaghị enwe nkwado Nzụkọ Katọlik.
Tupu emume ahụ, Pope Leo XIV dọrọ otu ahụ aka na ntị na ịchị bishọp ọhụrụ na-enweghị nkwado Vatican ga-abụ nnukwu mmehie ma mebie ịdị n'otu nke Ụka Katọlik.
Onye odeakwụkwọ nke Vatican steeti bụ Kadịnal Pietro Parolin kọwakwara na omume ahụ ga-ebute nnukwu ntaramahụhụ, gụnyere ịchụpụ n'ụka.
Vatican kwuru na ọ ka dị njikere ịnabata ndị otu SSPX ga-achọ ịlaghachi n'udo na Nzụkọ Katọlik.






























