Ihe iri dị mkpa i kwesịrị ịma gbasara Nkwekọrịta Aburi

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Henry Okonkwo
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Mgbe e biputara ya
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3
Nkwekọrịta Aburi bụ otu n'ime nzukọ kachasị mkpa n'akụkọ ihe mere eme na Naịjirịa.
O mere mgbe ndịisi ọchịchị agha zutere n'Aburi dị na mba Gana n'abalị anọ na ise nke ọnwa Jenụwarị afọ 1967, nke ebumnobi ya bụ ịchọta ụzọ a ga-esi gbochie agha obodo.
N'agbanyeghị na e nwere ọtụtụ nkwekọrịta, esemokwu gbasara etu e kwesịrị isi tinye ha n'ọrụ mechara bute Agha Bịafra.
Ụfọdụ ihe ndị kachasị pụta ihe i kwesịrị ịma

Ebe foto si, Getty Images
1. Ihe bụ Nkwekọrịta Aburi
Ọ bụ nkwekọrịta ndịisi ọchịchị agha Naịjirịa mere n'Aburi dị na mba Gana iji chọọ ụzọ ha ga-esi kwụsị ọgbaaghara na esemokwu ndọrọndọrọ ọchịchị nke malitere n'oge nkwatu ọchịchị ndịagha n'afọ 1966.
2. Ndị sonyere na nzukọ ahụ
Nzukọ ahụ kpọkọtara ndị nọ n'isi esemokwu ahụ, gụnyere onyeisi ọchịchị agha etiti bụ Yakubu Gowon, onyeisi mpaghara Ọwụwa Anyanwụ bụ Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu na ndị ọchịchị agha mpaghara ndị ọzọ, n'okpuru nduzi Ọchịagha J.A. Ankrah nke Gana.
3. Ha kwere nkwa na a gaghị eji agha edozi nsogbu ha
Ndị niile bịara Nkwekọrịta Aburi site n'akụkụ dị iche iche jikọrọ aka kwuo na ha agaghị eji agha dozie esemokwu Naịjịrịa. Ha kwusiri ike na ọ bụ naanị mkparịtaụka ga-eweta udo ga-adịgide adịgide.
4. Otu Supreme Military Council (SMC) ga-abụ ọchịchị kachasị elu
Ha nwere nkwekọrịta na Ọchịchị Ndịagha nke gọọmentị etiti ga-esi n'aka SMC mezuo ikike nchịkwa na nke imepụta iwu ha. Nke a pụtara na mkpebi ọbụla metụtara Naịjịrịa dum ga-enweta nkwado ndị ọchịchị agha mpaghara niile tupu e mee ya.
5. A chọrọ ka e nye mpaghara dị iche iche nnukwu ikike
Nkwekọrịta ahụ chọrọ ka ndị ọchịchị agha na mpaghara dị iche iche nwee ikike nchekwa na ịchịkwa ndịagha nọ n'ime mpaghara ha, iji hụ na ọchịchị etiti enweghị ikike karịrị akarị.

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
6. A ga-eme mgbanwe n'usoro ndịagha
Ha kwadoro ka e mepụta 'Area Commands' n'ogbe niile, ka mpaghara niile nwee nnọchiteanya n'isi ụlọọrụ ndịagha. Ha kwukwara ka a kwụsị ịkpọbata ndịagha ọhụrụ ruo mgbe e mechara nnyocha ọnọdụ ndịagha.
7. A ga-achịkwa nhọpụta ndị isi gọọmenti ọnụ
Nhọpụta na mbuli n'ọkwa ndịisi agha, ndị uweojii, ndị nnọchianya mba ọzọ na ndịisi ọrụ gọọmentị ga-abịa site na nkwenye otu 'Supreme Military Council'.
8. A ga-enyere ndị nsogbu metụtara aka
Ha kwadoro ka e hiwe kọmitii ga-ahụ maka ndị gbapụrụ n'ebe obibi ha, iweghachi akụnaụba ha na ịkwụ ndịọrụ gọọmenti hapụrụ ọrụ ha ụgwọ ruo ngwụcha Maachị 1967 ma ọ bụrụ na ha enwetebeghị ọrụ ọzọ.
9. Ha chọrọ ka e belata esemokwu gbasara ngwaagha
Ndịisi ahụ kwekọrọ ịkọrọ ibe ha ọnụ ọgụgụ ngwa agha ha nwere, kesaa ha n'ụzọ ziri ezi ma kwụsị ibubata ngwa agha ọhụrụ ruo mgbe udo ga-alọghachi.
10. Ihe mere nkwekọrịta ahụ jiri daa?
Mgbe nzukọ ahụ gachara, ọchịchị etiti na ọchịchị mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ghọtara nkwekọrịta ahụ n'ụzọ dị iche. Nghọtahie a mere ka ntụkwasịobi daa, mkparịtaụka kwụsị, Bịafra kwupụta nnwereonwe na Mee 1967, nke kpalitere agha ahụ na Julaị 1967.
N'ikpeazụ, ọtụtụ ndị ọkammụta kọwara na Nkwekọrịta Aburi bụ ohere ikpeazụ e nwere iji gbochie Agha Bịafra. Mana n'ihi na akụkụ abụọ ahụ ekwenyeghị n'etu e kwesịrị isi mejupụta ihe e kpebiri, nkwekọrịta ahụ dara, nke mechara bute otu n'ime agha obodo kacha njọ n'akụkọ ihe mere eme n'Afrịka.



























