Taa ka otu chọrọ ka ndị ntọrọbịa na nwaghọghọ chịa ala Naịjirịa mere ngagharị iwe n'Abuja.
Akpọrọ onweha Not Too Young to Run n'asụsụ bekee.
Ebe foto si, @YIAGA
Nkọwa foto, Otu nke a n'achọ ka onyeisiala binye aka n'akwụkwọ iwu ga-egbubilata afọ onye ga-agba ọsọ ọchịchị ala ga-adị tupu ọ baa ọchịchị
Ebe foto si, @YIAGA
Nkọwa foto, Ha kwukwara na obi tọrọ ha ụtọ na ndị omeiwu steeti di iche iche ebinyeela aka n'iwu a
Ebe foto si, @YIAGA
Nkọwa foto, Akwụkwọ iwu a dị n'aka ndị omeiwu ala n'Abuja
Ebe foto si, @YIAGA
Nkọwa foto, Otu nke a n'arịọ ndị omeiwuala ka ha zipu yabụ akwụkwọ nye onyeisiala Naịjirịa ka o binye aka na ya
Ebe foto si, @YIAGA
Nkọwa foto, N'echiche otu nke a, iwu ga-eme ka ndị okorobia na ndị nwaghọghọ so n'ọsọ ị chị ala Naịjirịa ga-eme na 2019
Ebe foto si, @YIAGA
Nkọwa foto, Otu kwuru na steetị ịrị atọ n'ise ebinyeela aka n'iwu a
Ebe foto si, @YIAGA
Nkọwa foto, Ha kwuru na nghagharị iwe ha taa bụ ịchetara onyeisiala Mohammadu Buhari na ndị ntorọbịa n'ele ya anya ka na-echekwa ka o mezu nkwa o kwere
Ugbu a onweghị ihe onyeisiala Mohammadu Buhari kwuru maka ngaghari iwe a ha mere taa.